< 2 Ihe E Mere 32 >

1 Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya.
After all these acts of faithfulness, Sennacherib king of Assyria came and invaded Judah. He laid siege to the fortified cities, intending to conquer them for himself.
2 Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem,
When Hezekiah saw that Sennacherib had come to make war against Jerusalem,
3 Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.
he consulted with his leaders and commanders about stopping up the waters of the springs outside the city, and they helped him carry it out.
4 Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha.
Many people assembled and stopped up all the springs and the stream that flowed through the land. “Why should the kings of Assyria come and find plenty of water?” they said.
5 Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
Then Hezekiah worked resolutely to rebuild all the broken sections of the wall and to raise up towers on it. He also built an outer wall and reinforced the supporting terraces of the City of David, and he produced an abundance of weapons and shields.
6 O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha,
Hezekiah appointed military commanders over the people and gathered the people in the square of the city gate. Then he encouraged them, saying,
7 “Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
“Be strong and courageous! Do not be afraid or discouraged before the king of Assyria and the vast army with him, for there is a greater One with us than with him.
8 Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
With him is only the arm of flesh, but with us is the LORD our God to help us and to fight our battles.” So the people were strengthened by the words of Hezekiah king of Judah.
9 Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
Later, as Sennacherib king of Assyria and all his forces besieged Lachish, he sent his servants to Jerusalem with a message for King Hezekiah of Judah and all the people of Judah who were in Jerusalem:
10 “Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
“This is what Sennacherib king of Assyria says: What is the basis of your confidence, that you remain in Jerusalem under siege?
11 Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.
Is not Hezekiah misleading you to give you over to death by famine and thirst when he says, ‘The LORD our God will deliver us from the hand of the king of Assyria?’
12 Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’?
Did not Hezekiah himself remove His high places and His altars and say to Judah and Jerusalem, ‘You must worship before one altar, and on it you shall burn sacrifices’?
13 “Unu amaghị ihe mụ na nna m ha bụ ndị bu m ụzọ chịa mere ndị ala ọzọ? Chi niile nke mba ndị ahụ niile ha nwere ike zọpụta ala ha site nʼaka m?
Do you not know what I and my fathers have done to all the peoples of the lands? Have the gods of these nations ever been able to deliver their land from my hand?
14 Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m?
Who among all the gods of these nations that my fathers devoted to destruction has been able to deliver his people from my hand? How then can your God deliver you from my hand?
15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!”
So now, do not let Hezekiah deceive you, and do not let him mislead you like this. Do not believe him, for no god of any nation or kingdom has been able to deliver his people from my hand or from the hand of my fathers. How much less will your God deliver you from my hand!”
16 Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda Onyenwe anyị Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha.
And the servants of Sennacherib spoke further against the LORD God and against His servant Hezekiah.
17 Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”
He also wrote letters mocking the LORD, the God of Israel, and saying against Him: “Just as the gods of the nations did not deliver their people from my hand, so the God of Hezekiah will not deliver His people from my hand.”
18 Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ.
Then the Assyrians called out loudly in Hebrew to the people of Jerusalem who were on the wall, to frighten and terrify them in order to capture the city.
19 Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.
They spoke against the God of Jerusalem as they had spoken against the gods of the peoples of the earth—the work of human hands.
20 Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.
In response, King Hezekiah and the prophet Isaiah son of Amoz cried out to heaven in prayer,
21 Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ.
and the LORD sent an angel who annihilated every mighty man of valor and every leader and commander in the camp of the king of Assyria. So he withdrew to his own land in disgrace. And when he entered the temple of his god, some of his own sons struck him down with the sword.
22 Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.
So the LORD saved Hezekiah and the people of Jerusalem from the hands of King Sennacherib of Assyria and all the others, and He gave them rest on every side.
23 Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya.
Many brought offerings to Jerusalem for the LORD and valuable gifts for Hezekiah king of Judah, and from then on he was exalted in the eyes of all nations.
24 Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
In those days Hezekiah became mortally ill. So he prayed to the LORD, who spoke to him and gave him a sign.
25 Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
But because his heart was proud, Hezekiah did not repay the favor shown to him. Therefore wrath came upon him and upon Judah and Jerusalem.
26 Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
Then Hezekiah humbled the pride of his heart—he and the people of Jerusalem—so that the wrath of the LORD did not come upon them during the days of Hezekiah.
27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
Hezekiah had very great riches and honor, and he made treasuries for his silver, gold, precious stones, spices, shields, and all kinds of valuable articles.
28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
He also made storehouses for the harvest of grain and new wine and oil, stalls for all kinds of livestock, and pens for the flocks.
29 O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
He made cities for himself, and he acquired herds of sheep and cattle in abundance, for God gave him very great wealth.
30 Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
It was Hezekiah who blocked the upper outlet of the Spring of Gihon and channeled it down to the west side of the City of David. And Hezekiah prospered in all that he did.
31 Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
And so when ambassadors of the rulers of Babylon were sent to him to inquire about the wonder that had happened in the land, God left him alone to test him, that He might know all that was in Hezekiah’s heart.
32 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
As for the rest of the acts of Hezekiah and his deeds of loving devotion, they are indeed written in the vision of the prophet Isaiah son of Amoz in the Book of the Kings of Judah and Israel.
33 Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
And Hezekiah rested with his fathers and was buried in the upper tombs of David’s descendants. All Judah and the people of Jerusalem paid him honor at his death. And his son Manasseh reigned in his place.

< 2 Ihe E Mere 32 >