< 2 Ihe E Mere 31 >

1 Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.
When all this had finished, the Israelites who were there went to the towns of Judah and smashed the pagan pillars, cut down the Asherah poles, and destroyed the high places and altars throughout Judah and Benjamin, as well as in Ephraim and Manasseh, until they had completely demolished all of them. After that they all went home to their respective towns.
2 Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya.
Then Hezekiah reallocated the divisions of the priests and Levites, each according to their service: presenting burnt offerings and friendship offerings, serving, giving thanks, and singing praises at the entrances of the Lord's Temple.
3 Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.
The king contributed personally towards the morning and evening burnt offerings, and for the burnt offerings on the Sabbaths, new moons, and special feasts, as required by the Law of the Lord.
4 O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị.
He also ordered the people living in Jerusalem to provide for the priests and Levites so that they could dedicate themselves to studying and teaching the Law of the Lord.
5 Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.
As soon as the message went out, the Israelites generously gave the firstfruits of the grain, new wine, olive oil, and honey, and of all the crops. They brought plenty, a tithe of everything.
6 Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu
The people of Israel now living in Judah, and the people of Judah brought a tithe of their herds and flocks. They also brought a tithe of what had been dedicated to the Lord their God, and piled them up.
7 Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
They started doing this in the third month, and they finished in the seventh month.
8 Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
When Hezekiah and his officials came and saw what had been collected, they thanked the Lord and his people Israel.
9 Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
Hezekiah asked the priests and Levites about what had been collected.
10 Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”
Azariah, the chief priest of the family of Zadok, answered, “Ever since the people began to bring their contributions into the Lord's Temple, we have had enough to eat and plenty to spare. Because the Lord has blessed his people there is so much left over.”
11 Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.
Hezekiah ordered the construction of storehouses in the Lord's Temple. Once they were ready,
12 Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya.
the people faithfully brought in their offerings, tithes, and dedicated gifts. Conaniah the Levite was the one who was responsible for them, and his brother Shimei was second in command.
13 Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.
They were in charge of the following officers: Jehiel, Azaziah, Nahath, Asahel, Jerimoth, Jozabad, Eliel, Ismachiah, Mahath, and Benaiah were overseers who assisted Conaniah and Shimei his brother. They were appointed by King Hezekiah and Azariah, the chief officer of God's Temple.
14 Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ.
Kore, son of Imnah, the Levite, the gatekeeper of the East Gate, was responsible for receiving the freewill offerings given to God. He also distributed the offerings given to the Lord, together with the consecrated gifts.
15 Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
Under him were his assistants Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaiah, Amariah, and Shecaniah. They faithfully made the allocations to their fellow Levites in their towns, according to the priestly divisions, sharing equally with the old and young.
16 Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị.
They also gave allowances to the males listed in the genealogy who were three years of age or older, to all who would enter the Lord's Temple to perform their daily duties of serving according to the responsibilities of their divisions.
17 Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị.
They also gave allowances to the priests listed by family in the genealogy, and to the Levites twenty years of age or older, according to the responsibilities of their divisions.
18 Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.
The genealogy included all the babies, wives, sons, and daughters of the whole community, for they were faithful in making sure they dedicated themselves as holy.
19 A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.
In the case of the priests, the descendants of Aaron, those who lived on the farmlands around their towns, men were appointed by name in all the towns to distribute an allocation to every male among the priests and to every Levite as listed in the genealogies.
20 Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
This is what Hezekiah did throughout the whole of Judah. He did what was good, right, and true before the Lord his God.
21 Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.
In everything he did in working for God's Temple and in following God's laws and commandments, Hezekiah was sincere in his commitment to God. So he was successful in all he did.

< 2 Ihe E Mere 31 >