< 2 Ihe E Mere 29 >
1 Hezekaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
Hezekiah began to reign when he was twenty-five years old; he reigned twenty-nine years in Jerusalem. His mother's name was Abijah; she was the daughter of Zechariah.
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
He did what was right in the eyes of Yahweh, just as David his father had done.
3 Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
In the first year of his reign, in the first month, Hezekiah opened the doors of the house of Yahweh and repaired them.
4 Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
He brought in the priests and the Levites, and gathered them together into the courtyard on the east side.
5 gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
He said to them, “Listen to me, you Levites! Consecrate yourselves, and consecrate the house of Yahweh, the God of your ancestors, and carry away the filthiness from the holy place.
6 Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
For our ancestors trespassed and did what was evil in the sight of Yahweh our God; they forsook him, turned away their faces from the place where Yahweh lives, and turned their backs on it.
7 Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
Also they shut up the doors of the porch and put out the lamps; they did not burn incense or offer burnt offerings in the holy place to the God of Israel.
8 Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.
Therefore the wrath of Yahweh had fallen on Judah and Jerusalem, and he has made them to be an object of terror, of horror, and of scorn, as you can see with your own eyes.
9 E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.
This is why our fathers have fallen by the sword, and our sons, our daughters, and our wives are in captivity for this.
10 Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.
Now it is in my heart to make a covenant with Yahweh, the God of Israel, so that his fierce anger may turn away from us.
11 Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
My sons, do not be lazy now, for Yahweh has chosen you to stand before him, to worship him, and that you should be his servants and burn incense.”
12 Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
Then the Levites arose: Mahath son of Amasai, and Joel son of Azariah, of the people of the Kohathites; and of the people of Merari, Kish son of Abdi, and Azariah son of Jehallelel; and of the Gershonites, Joah son of Zimmah, and Eden son of Joah;
13 nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya;
of the sons of Elizaphan, Shimri and Jeuel; and of the sons of Asaph, Zechariah and Mattaniah;
14 nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel.
of the sons of Heman, Jehuel and Shimei; and of the sons of Jeduthun, Shemaiah and Uzziel.
15 Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.
They gathered their brothers, they consecrated themselves, and they went in, as the king commanded, following the words of Yahweh, to cleanse the house of Yahweh.
16 Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.
The priests went in to the inner part of the house of Yahweh to cleanse it; they brought out all the filth that they found in the temple of Yahweh into the courtyard of the house. The Levites took it to carry it out to the brook Kidron.
17 Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.
Now they began the consecration on the first day of the first month. By the eighth day of the month they reached the porch of Yahweh. Then for eight more days they consecrated the house of Yahweh. On the sixteenth day of the first month they finished.
18 Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.
Then they went to Hezekiah, the king, inside the palace and said, “We have cleansed all the house of Yahweh, the altar for burnt offerings with all its implements, and the table of the bread of the presence, with all its implements.
19 Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”
So we have prepared and we have consecrated all the items that King Ahaz removed when he acted unfaithfully during his reign. See, they are in front of the altar of Yahweh.”
20 Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.
Then Hezekiah the king rose early in the morning and gathered the leaders of the city; he went up to the house of Yahweh.
21 Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
They brought seven bulls, seven rams, seven lambs, and seven male goats as a sin offering for the kingdom, for the sanctuary, and for Judah. He commanded the priests, the sons of Aaron, to offer them on the altar of Yahweh.
22 Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja.
So they killed the bulls, and the priests received the blood and sprinkled it on the altar. Then they killed the rams and sprinkled their blood on the altar; and they also killed the lambs and sprinkled their blood on the altar.
23 Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu.
They brought the male goats for the sin offering before the king and the assembly; they laid their hands on them.
24 Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile.
The priests killed them, and they made a sin offering with their blood on the altar to make atonement for all Israel, for the king had commanded that a burnt offering and a sin offering should be made for all Israel.
25 O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.
Hezekiah placed the Levites in the house of Yahweh with cymbals, harps, and lyres, arranging them by the command of David, Gad, the king's seer, and Nathan, the prophet, for the command was from Yahweh by means of his prophets.
26 Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.
The Levites stood with the instruments of David, and the priests with the trumpets.
27 Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.
Hezekiah commanded them to offer the burnt offering on the altar. When the burnt offering began, the song of Yahweh began also, with the trumpets, together with the instruments of David, king of Israel.
28 Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ.
All the assembly worshiped, the singers sang, and the trumpeters played; all this continued until the burnt offering was finished.
29 Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala.
When they had finished the offerings, the king and all who were present with him bowed and worshiped.
30 Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too Onyenwe anyị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke.
Moreover, Hezekiah, the king, and the leaders commanded the Levites to sing praises to Yahweh with the words of David and of Asaph, the seer. They sang praises with gladness, and they bowed down and worshiped.
31 Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye Onyenwe anyị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ.
Then Hezekiah said, “Now you have consecrated yourselves to Yahweh. Come here and bring sacrifices and thank offerings into the house of Yahweh.” The assembly brought sacrifices and thank offerings, and all who had a willing heart brought burnt offerings.
32 Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
The number of the burnt offerings that the assembly brought was seventy bulls, one hundred rams, and two hundred male lambs. All these were for a burnt offering to Yahweh.
33 Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ.
The consecrated offerings were six hundred oxen and three thousand sheep.
34 Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.
But the priests were too few to skin all the burnt offerings, so their brothers, the Levites, helped them until the work was done, and until the priests could consecrate themselves, for the Levites had been more careful to consecrate themselves than the priests.
35 Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
In addition, there were very many burnt offerings; they were performed with the fat of the fellowship offerings, and there were drink offerings for every burnt offering. So the service of the house of Yahweh was set in order.
36 Hezekaya na ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ihe Chineke doziri nye ndị ya, nʼihi na ihe niile ndị a mere ngwangwa.
Hezekiah rejoiced, and all the people also, because of what God had prepared for the people, for the work had been done quickly.