< 2 Ihe E Mere 28 >

1 Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya Devid mere.
Ahaz was twenty when he became king, and he reigned in Jerusalem for sixteen years. He did not do what was right in the Lord's sight as his forefather David had.
2 Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal.
He followed the example of the kings of Israel, and also cast metal idols for worshiping the Baals.
3 O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
He burned sacrifices in the Valley of Ben Hinnom, and sacrificed his children in the fire, following the disgusting practices of the peoples the Lord had driven out before the Israelites.
4 Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.
He presented sacrifices and burned incense offerings on the high places, on the mountain tops, and under every living tree.
5 Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs. E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya.
As a result, the Lord his God let the king of Aram to conquer Ahaz. The Arameans attacked him and captured many of his people, taking them to Damascus. Ahaz was also defeated by the king of Israel in a massive attack.
6 Nʼotu ụbọchị, Peka nwa Remalaya gburu narị puku ndị agha Juda na iri puku abụọ. Ihe ndị a mere nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha azụ.
In just one day, Pekah, son of Remaliah, killed 120,000 fighting men in Judah, because they had abandoned the Lord, the God of their fathers.
7 Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze.
Zichri, a warrior from Ephraim, killed Maaseiah, the son of the king; Azrikam, the palace governor; and Elkanah, the king's second-in-command.
8 Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria.
The Israelites captured 200,000 of their “brothers”—women, sons, and daughters. They also took a great deal of plunder and brought it to Samaria.
9 Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.
But a prophet of the Lord named Oded was there in Samaria, and he went out to meet the returning army. He told them, “It was because the Lord, the God of your fathers, was angry with Judah that he allowed you to defeat them. But you have killed them with such fury that it has upset heaven.
10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
Now you're planning to turn these people from Judah and Jerusalem into slaves. But aren't you also guilty of sinning against the Lord your God?
11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
Listen to me! Return the prisoners you've taken from your brothers, the fierce anger of the Lord is falling upon you!”
12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
Some of the leaders of the people of Ephraim—Azariah, son of Jehohanan, Berechiah, son of Meshillemoth, Jehizkiah, son of Shallum, and Amasa, son of Hadlai—stood up in opposition against those returning from the war.
13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
“Don't you bring those prisoners here!” they told them. “If you do you will only add to our sins and wrongdoing against the Lord. Our guilt is already great, and his fierce anger is falling upon Israel.”
14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
So the armed men left the prisoners and the plunder before the leaders and all the people gathered there.
15 Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
The men named above got up and took clothes from the plunder to those that had none, gave them sandals to wear, and food and drink, and put olive oil on their wounds. Those who couldn't walk any more they put on donkeys, and took them all to Jericho, the town of palms, to be close to the people of Judah.
16 Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.
It was then that King Ahaz asked the king of Assyria for help.
17 Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha.
The armies of Edom had once again invaded Judah and taken people prisoner,
18 Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu.
while the Philistines had attacked the towns in the foothills and the Negev of Judah. They had captured and occupied Beth-shemesh, Aijalon, Gederoth, along with Soco, Timnah, and Gimzo and their villages.
19 Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị.
The Lord had brought Judah down because Ahaz, king of Israel, was out of control in Judah, sinning terribly against the Lord.
20 Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.
So Tiglath-pileser, king of Assyria, came to Ahaz but attacked rather than helped him.
21 Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
Ahaz took what was valuable from the Lord's Temple, the king's palace, and from his officials and gave them to the king of Assyria as tribute. But it didn't help him.
22 Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
Even at this time when he was having so much trouble, King Ahaz sinned more and more against the Lord.
23 Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
He sacrificed to the gods of Damascus, whose army had defeated him, for he said to himself, “Since the gods of the kings of Aram helped them, I'll sacrifice to them so they can help me.” But this led to the ruin of Ahaz and of all Israel.
24 Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.
Ahaz took the sacred items from the Lord's Temple and smashed them to pieces. He barred the doors of the Lord's Temple and set up pagan altars on every corner in Jerusalem.
25 Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
In every town throughout Judah he set up high places to make offerings to pagan gods, angering the Lord, the God of his forefathers.
26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel?
The rest of what Ahaz did, from beginning to end, is written down in the Book of the Kings of Judah and Israel.
27 Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Ahaz died, and they buried him in the city, in Jerusalem. They did not bury him in the tombs of the kings of Israel. Hezekiah his son took over as king.

< 2 Ihe E Mere 28 >