< 2 Ihe E Mere 27 >
1 Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk.
Yotamu anakhala mfumu ali ndi zaka 25 ndipo analamulira mu Yerusalemu kwa zaka 16. Dzina la amayi ake linali Yerusa mwana wa Zadoki.
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ.
Iye anachita zolungama pamaso pa Yehova, monga anachitira Uziya abambo ake, kupatula kuti iyeyo sanalowe mʼNyumba ya Yehova. Komabe anthu anapitirira kuchita zoyipa.
3 Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel.
Yotamu anamanganso chipata chakumtunda cha Nyumba ya Yehova ndipo anagwira ntchito yayikulu yomanga khoma la ku phiri la Ofeli.
4 O wuru ọtụtụ obodo nʼala ugwu ugwu Juda, wuokwa ọtụtụ ebe e wusiri ike na ụlọ elu nche nʼoke ọhịa.
Iye anamanga mizinda mʼmapiri a ku Yuda ndipo anamanganso malinga ndi nsanja mʼmadera a ku nkhalango.
5 Jotam busoro eze ndị Amọn agha, meriekwa ha. Nʼafọ ahụ, ndị Amọn bunyere ya narị talenti ọlaọcha, na bushel ọka iri puku na puku abụọ, na bushel ọka balị iri puku na puku abụọ.
Yotamu anachita nkhondo ndi mfumu ya Aamoni ndipo anawagonjetsa. Chaka chimenecho Aamoni anapereka makilogalamu 3,400, matani 1,000 a tirigu ndiponso matani 1,000 a barele. Aamoni anabweretsa zinthu zomwezi chaka chachiwiri ndi chachitatu.
6 Jotam ghọrọ eze dị ike nʼihi na ọ kpachara anya debe iwu Onyenwe anyị Chineke ya.
Yotamu anakula mphamvu chifukwa anayenda molungama pamaso pa Yehova Mulungu wake.
7 Ihe ndị ọzọ niile nʼoge ọchịchị Jotam, tinyere ihe gbasara agha niile ọ lụrụ, na ihe ndị ọzọ niile nke o mere, e deturu ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
Zina ndi zina zokhudza ulamuliro wa Yotamu, kuphatikizapo nkhondo zake zonse ndi zinthu zina zimene anachita, zinalembedwa mʼbuku la mafumu a Israeli ndi Yuda.
8 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem.
Iye anakhala mfumu ali ndi zaka 25 ndipo analamulira mu Yerusalemu kwa zaka 16.
9 Jotam sooro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Yotamu anamwalira ndipo anayikidwa mʼmanda mu Mzinda wa Davide. Ndipo Ahazi mwana wake analowa ufumu mʼmalo mwake.