< 2 Ihe E Mere 26 >

1 Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.
All the people of Judah took Uzziah, sixteen years old, and made him king in succession to his father Amaziah.
2 Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
He rebuilt Eloth and brought it back into the kingdom of Judah after Amaziah died.
3 Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.
Uzziah was sixteen when he became king, and he reigned in Jerusalem for fifty-two years. His mother's name was Jecoliah and she came from Jerusalem.
4 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
He did what was right in the Lord's sight as his father Amaziah had done.
5 Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
He worshiped God during the lifetime of Zechariah, who taught him to respect God. As long as he followed the Lord, God made him successful.
6 O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia.
Uzziah went to war against the Philistines, and he demolished the walls of Gath, Jabneh, and Ashdod. Then he built cities around Ashdod and in other Philistine areas.
7 Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.
God helped him against the Philistines, against the Arabians living in Gurbaal, and against the Meunites.
8 Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
The Meunites brought gifts as tribute to Uzziah. His reputation spread as far as the border of Egypt, for he became very powerful.
9 O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike.
Uzziah built defensive towers in Jerusalem at the Corner Gate and the Valley Gate, and at the corner, and strengthened them.
10 O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
He also built towers in the desert and cut many water cisterns out of the rock, because he had a great deal of livestock in the foothills and on the plains. He had farmers and vineyard workers in the hills and in the fertile lowlands, for he loved the soil.
11 Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha.
Uzziah had an army of battle-ready soldiers, in divisions according to the numbers in the listing made by Jeiel the secretary and Maaseiah the official, under the direction of Hananiah, one of the king's commanders.
12 Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600.
The total number of family leaders was 2,600 fighting men.
13 Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya.
Under their command was an army of 307,500 trained for battle, who had the power to help the king fight against the enemy.
14 Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.
Uzziah supplied shields, spears, helmets, armor, bows, and slingstones for the whole army.
15 O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
He also made skillfully designed war machines to fire arrows and large stones from the towers and corners of the wall. His reputation spread far and wide, for he received extraordinary help until he became really powerful.
16 Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.
But because he was powerful he became arrogant, and this sled to his ruin. For he was unfaithful to the Lord his God, and he himself entered the Lord's Temple to burn incense on the altar of incense.
17 Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ.
Azariah the priest went in after him, with eighty brave priests of the Lord.
18 Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
They stood up to him, and told him, “It's not your place to burn incense to the Lord. Only the priests, the descendants of Aaron, who have been set apart as holy may burn incense. Get out of the sanctuary, for you have sinned, and the Lord God will not bless you.”
19 Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
Uzziah, who was holding a censer in his hand to offer incense, became furious. But as he raged at the priests in the Lord's Temple in front of the altar of incense, leprosy appeared on his forehead.
20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
When Azariah the chief priest and all the priests looked at him and saw the leprosy on his forehead, they rushed him out. In fact he too was in a hurry to leave, because the Lord had struck him.
21 Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
King Uzziah was a leper until the day he died. He lived by himself as a leper, barred from entering the Lord's Temple, while his son Jotham was placed in charge or the king's affairs and governed the country.
22 Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.
The rest of what Uzziah did, from beginning to end, was written down by the prophet Isaiah, son of Amoz.
23 Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Uzziah died and was buried near them in a cemetery belonging to the kings, for people said, “He was a leper.” His son Jotham took over as king.

< 2 Ihe E Mere 26 >