< 2 Ihe E Mere 26 >

1 Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.
Kenaka anthu onse a ku Yuda anatenga Uziya amene anali wa zaka 16, namuyika kukhala mfumu mʼmalo mwa Amaziya abambo ake.
2 Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
Iye anamanganso mzinda wa Eloti ndi kuwubwezeranso ku Yuda abambo ake atamwalira.
3 Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.
Uziya anali wa zaka 16 pamene anakhala mfumu ndipo analamulira mu Yerusalemu kwa zaka 70. Dzina la amayi ake linali Yekoliya wa ku Yerusalemu.
4 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
Iye anachita zolungama pamaso pa Yehova, monga momwe anachitira Amaziya abambo ake.
5 Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
Iye anapembedza Mulungu nthawi ya Zekariya, amene ankamulangiza za kuopa Mulungu amene anamupatsa chipambano.
6 O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia.
Iyeyo anapita kukachita nkhondo ndi Afilisti ndipo anagwetsa makoma a Gati, Yabine ndi Asidodi. Ndipo kenaka anamanganso mizinda ya pafupi ndi Asidodi ndi malo ena pafupi ndi Afilisti.
7 Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.
Mulungu anamuthandiza polimbana ndi Afilisti ndi Aarabu amene amakhala ku Guri-Baala ndiponso polimbana ndi Ameuni.
8 Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
Aamoni ankabweretsa msonkho kwa Uziya ndipo mbiri yake inamveka mpaka ku malire a dziko la Igupto chifukwa anali wamphamvu kwambiri.
9 O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike.
Uziya anamanga nsanja ku Yerusalemu ku Chipata Chapangodya, ku Chigwa cha Chipata ndi pokhotera mpanda, ndipo anayikamo chitetezo.
10 O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
Iye anamanganso nsanja ku chipululu ndi kukumbanso zitsime zambiri chifukwa anali ndi ziweto zambiri mʼmbali mwa phiri ndi ku zigwa. Iye anali ndi anthu amene ankagwira ntchito mʼminda yake ndiponso mʼminda yake ya mphesa mʼphiri ndi malo achonde, pakuti ankakonda nthaka.
11 Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha.
Uziya anali ndi gulu lankhondo lophunzitsidwa bwino, lokonzekera kupita ku nkhondo mʼmagulu monga mwa chiwerengero chawo chimene mlembi Yeiyeli ndi Maaseya anasonkhanitsa motsogozedwa ndi Hananiya mmodzi mwa akuluakulu a mfumu.
12 Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600.
Chiwerengero chonse cha atsogoleri a mʼmabanja oyangʼanira anthu ochita nkhondo chinali 2,600.
13 Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya.
Pansi pa ulamuliro wawo panali asilikali 307,500 ophunzitsidwa nkhondo, gulu lamphamvu lothandiza mfumu kulimbana ndi adani ake.
14 Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.
Uziya anawapangira asilikaliwo zishango, mikondo, zipewa zankhondo, malaya ankhondo achitsulo, mauta ndi miyala yogendera.
15 O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
Mu Yerusalemu anapanga makina okonzedwa ndi anthu aluso amene amagwiritsidwa ntchito pa malo otetezera a pa nsanja ndi pa ngodya kuponyera mivi ndi kugubuduzira miyala. Mbiri yake inamveka kutali ndi ponseponse pakuti anathandizidwa kwambiri mpaka anakhala wamphamvu kwambiri.
16 Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.
Koma pamene Uziya anakhala wamphamvu kwambiri, kunyada kwake kunamuwononga. Iye sanakhulupirike kwa Yehova Mulungu wake, ndipo analowa mʼNyumba ya Yehova kukafukiza lubani pa guwa lofukizira.
17 Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ.
Wansembe Azariya pamodzi ndi ansembe a Yehova ena 80 olimba mtima anamutsatira.
18 Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
Iwo anatsutsana naye ndipo anati, “Sibwino kuti inu mfumu muzifukiza lubani koma zidzukulu za Aaroni, zimene zinapatulidwa kuti zizifukiza lubani. Chokani pa malo opatulika ano, pakuti inu mwakhala osakhulupirika, ndipo simudzalemekezedwa ndi Yehova Mulungu.”
19 Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
Uziya, amene anali ndi chofukizira mʼmanja mwake wokonzeka kuti afukize lubani, anapsa mtima. Iye anakwiyira ansembewo. Ndipo ansembe aja akuona patsogolo pa guwa lofukizira lubani mʼNyumba ya Mulungu, khate linayamba pamphumi pake.
20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
Azariya, mkulu wa ansembe pamodzi ndi ansembe ena onse atamuyangʼana anaona kuti anali ndi khate pamphumi pake, ndipo anamutulutsa mofulumira. Ndipo iye mwini anafulumira kutuluka, chifukwa Yehova anamulanga.
21 Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
Mfumu Uziya anali ndi khate mpaka tsiku limene anamwalira. Iye amakhala mʼnyumba ya yekha ngati wakhate, ndipo samalowa mʼNyumba ya Yehova. Yotamu mwana wake ndiye amayangʼanira nyumba yaufumu ndipo ankalamulira anthu a mʼdzikomo.
22 Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.
Ntchito zina za mfumu Uziya, kuyambira pachiyambi mpaka pa mapeto, zinalembedwa ndi mneneri Yesaya mwana wa Amozi.
23 Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Uziya analondola makolo ake, ndipo anamuyika pamodzi ndi makolo ake ku malo a manda a mafumu, koma osati mʼmanda mwawomo poti anthu anati, “Iyeyu anali ndi khate.” Ndipo Yotamu mwana wake analowa ufumu mʼmalo mwake.

< 2 Ihe E Mere 26 >