< 2 Ihe E Mere 23 >

1 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri.
But in the seventh year, Jehoiada had the courage to act. He made a pledge with the commanders of hundreds: Azariah, son of Jeroham, Ishmael, son of Jehohanan, Azariah, son of Obed, Maaseiah, son of Adaiah, and Elishaphat, son of Zichri.
2 Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,
They traveled all over Judah and brought together the Levites from all the cities of Judah and the family leaders of Israel. When they came to Jerusalem,
3 ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.
they all assembled at God's Temple and made a solemn agreement with the king. Jehoiada announced to them, “Look, here is the king's son and he must reign, just as the Lord promised the descendants of David would.
4 Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.
Here's what you have to do. One third of you priests and Levites who enter on the Sabbath shall guard the entrances.
5 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.
Another third shall go over to the king's palace, while the last third shall be at the Foundation Gate. Everyone else stay in the courtyards of the Lord's Temple.
6 Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.
No one should enter the Lord's Temple except the priests and those Levites are serving. They can enter because they have been made holy, but everyone else must follow the Lord's commands.
7 Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
The Levites shall surround the king, weapons in hand. Kill anyone who enters the Temple. Stay close to the king wherever he goes.”
8 Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile.
The Levites and all the people of Judah did everything that Jehoiada the priest told them. The commanders each brought his men, both those coming on duty on the Sabbath and those going off duty, for Jehoiada the priest had not dismissed any of the divisions.
9 O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.
Jehoiada the priest provided the commanders with the spears and the large and small shields of King David that were in God's Temple.
10 O guzobere ndị ikom niile ahụ, onye ọbụla ji ngwa agha ya nʼaka ya, nọdụ eze gburugburu na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu ahụ. Site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
He placed them all, with their weapons in hand, to surround the king from the south side of the Temple to the north side, and near the altar and the Temple.
11 Jehoiada na ụmụ ya ndị ikom kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, ha nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze, tie mkpu sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
Jehoiada and his sons then brought out the king's son, placed the crown on him, presented him with a copy of God's law, and proclaimed him king. They anointed him, and shouted out, “Long live the king!”
12 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
When Athaliah heard the noise of people running and shouting praise to the king, she rushed to the crowds at the Lord's Temple.
13 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
She saw the king standing by his pillar at the entrance. The commanders and trumpeters were with the king, and everyone was celebrating and blowing trumpets as the singers with musical instruments led the praise. Athaliah ripped her clothes and screamed out, “Treason! Treason!”
14 Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”
Jehoiada ordered the army commanders, “Bring her to the men standing in front of the Temple, and kill anyone who follows her.” Earlier the priest had made it clear, “She must not be killed in the Lord's Temple.”
15 Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.
They grabbed hold of her and took her to the entrance of the Horse Gate of the king's palace, and killed her there.
16 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.
Then Jehoiada made a solemn agreement between himself and all the people and the king that they would be the Lord's people.
17 Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
Everyone went to the Temple of Baal and tore down its altars and smashed the idols. They killed Mattan, the priest of Baal, right in front of the altar.
18 Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.
Jehoiada placed the responsibility for the Lord's Temple in the hands of the Levitical priests. They were the ones whom David had appointed over the Lord's Temple to offer burnt offerings to the Lord, as is required by the Law of Moses, with celebration and singing, as David instructed.
19 O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye.
He placed gatekeepers at the entrances to the Lord's Temple, so that no one unclean for any reason could enter.
20 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.
Along with the commanders, the nobles, the governors of the people, and all the people, he led the king in a procession down from the Lord's Temple through the upper gate to the royal palace. There they set the king on the royal throne.
21 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
All throughout the land people celebrated, and Jerusalem was at peace, because Athaliah had been killed by the sword.

< 2 Ihe E Mere 23 >