< 2 Ihe E Mere 21 >

1 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
And Jehoshaphat slept with his fathers, and was buried with his fathers in the city of David; and Jehoram his son reigned in his stead.
2 Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.
And he had brethren the sons of Jehoshaphat, Azariah, and Jehiel, and Zechariah, and Azariahu, and Michael, and Shephatiah; all these were the sons of Jehoshaphat king of Israel.
3 Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
And their father gave them great gifts, of silver, and of gold, and of precious things, with fortified cities in Judah; but the kingdom gave he to Jehoram, because he was the first-born.
4 Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel.
Now when Jehoram was risen up over the kingdom of his father, and had strengthened himself, he slew all his brethren with the sword, and divers also of the princes of Israel.
5 Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
Jehoram was thirty and two years old when he began to reign; and he reigned eight years in Jerusalem.
6 O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
And he walked in the way of the kings of Israel, as did the house of Ahab; for he had the daughter of Ahab to wife; and he did that which was evil in the sight of the LORD.
7 Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Howbeit the LORD would not destroy the house of David, because of the covenant that He had made with David, and as He promised to give a lamp to him and to his children alway.
8 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
In his days Edom revolted from under the hand of Judah, and made a king over themselves.
9 Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu.
Then Jehoram passed over with his captains, and all his chariots with him; and he rose up by night, and smote the Edomites that compassed him about, and the captains of the chariots.
10 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.
So Edom revolted from under the hand of Judah unto this day; then did Libnah revolt at the same time from under his hand; because he had forsaken the LORD, the God of his fathers.
11 O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.
Moreover he made high places in the mountains of Judah, and made the inhabitants of Jerusalem to go astray, and drew Judah away.
12 Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
And there came a writing to him from Elijah the prophet, saying: 'Thus saith the LORD, the God of David thy father: Because thou hast not walked in the ways of Jehoshaphat thy father, nor in the ways of Asa king of Judah;
13 kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.
but hast walked in the way of the kings of Israel, and hast made Judah and the inhabitants of Jerusalem to go astray, like as the house of Ahab made Israel to go astray; and also hast slain thy brethren of thy father's house, who were better than thyself;
14 Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.
behold, the LORD will smite with a great plague thy people, and thy children, and thy wives, and all thy substance;
15 Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’”
and thou shalt have great sickness by disease of thy bowels, until thy bowels fall out by reason of the sickness, day by day.'
16 Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha.
And the LORD stirred up against Jehoram the spirit of the Philistines, and of the Arabians that are beside the Ethiopians;
17 Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
and they came up against Judah, and broke into it, and carried away all the substance that was found in the king's house, and his sons also, and his wives; so that there was never a son left him, save Jehoahaz, the youngest of his sons.
18 Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.
And after all this the LORD smote him in his bowels with an incurable disease.
19 Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
And it came to pass, that in process of time, at the end of two years, his bowels fell out by reason of his sickness, and he died of sore diseases. And his people made no burning for him, like the burning of his fathers.
20 Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.
Thirty and two years old was he when he began to reign, and he reigned in Jerusalem eight years; and he departed joyless; and they buried him in the city of David, but not in the sepulchres of the kings.

< 2 Ihe E Mere 21 >