< 2 Ihe E Mere 20 >

1 Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.
Shure kwaizvozvi vaMoabhu navaAmoni navamwe vaMeuni vakauya kuzorwa naJehoshafati.
2 Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”
Vamwe varume vakauya vakaudza Jehoshafati kuti, “Hondo huru kwazvo iri kuuya kuzokurwisai kubva kuEdhomu, vachibva mhiri kweGungwa. Yatova muHazazoni Tamari (zvichireva Eni Gedhi).”
3 Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
Achitya, Jehoshafati akafunga kundobvunza Jehovha, akadaidzira kuti Judha yose itsanye.
4 Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
Vanhu veJudha vakaungana pamwe chete kuti vatsvage rubatsiro kubva kuna Jehovha. Zvirokwazvo, vakabva mumaguta ose eJudha kuzomutsvaka.
5 Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
Ipapo Jehoshafati akamira muungano yeJudha neJerusarema patemberi yaJehovha pamberi pechivanze chitsva,
6 sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
uye akati: “Haiwa Jehovha, Mwari wamadzibaba edu, hamusimi here Mwari wokudenga? Munotonga umambo hwose huri panyika. Simba noukuru zviri muruoko rwenyu. Uye hapana angagona kukukundai.
7 O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?
Haiwa Mwari wedu, hamuna here kudzinga vagari venyika ino pamberi pavanhu venyu Israeri mukaipa zvachose kuvana vaAbhurahama, shamwari yenyu?
8 Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị,
Vakararama mairi, uye vakavakira mairi imba yeZita renyu vachiti,
9 ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
‘Kana dambudziko rikatiwira, ringava pfumo rokutonga kana denda, kana nzara, tichamira muuvepo hwenyu pamberi petemberi ine Zita renyu, uye tichachema kwamuri mukutambudzika kwedu uye imi muchatinzwa mugotinunura.’
10 “Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
“Asi zvino ava varume vabva kuAmoni, Moabhu neGomo reSeiri vane nyika yamusina kutendera Israeri kuti itore payakabva kuIjipiti. Saka vakavarega uye vakasavaparadza.
11 Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.
Onai kuti vava kutiripa sei nokuuya kwavo kuzotidzinga munyika yamakatipa senhaka.
12 O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
Haiwa Mwari wedu, hamungavatongi here? Nokuti isu hatina simba rokutonga hondo huru yakadai iri kuuya kuzotirwisa. Hatizivi kuti tingaita sei, asi meso edu akatarisa kwamuri.”
13 Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.
Varume vose veJudha, navakadzi vavo navana vadiki, vakamira pamberi paJehovha.
14 Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ.
Ipapo mweya waMwari wakauya pana Jahazieri mwanakomana waZekaria, mwanakomana waBhenaya, mwanakomana waJeyeri, mwanakomana waMatania muRevhi uye chizvarwa chorudzi rwaAsafi, paakanga akamira muungano.
15 Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.
Akati, “Teererai, Mambo Jehoshafati navose vanogara muJudha neJerusarema! Zvanzi naJehovha kwamuri, ‘Musatya kana kuora mwoyo nokuda kwehondo iyi huru, nokuti kurwa uku hakusi kwenyu, asi ndokwaMwari.
16 Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.
Mangwana dzikai mundovarwisa. Vachange vachikwidza nomuMupata weZizi uye muchavawana kumagumo omupata muGwenga reJerueri.
17 Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’”
Hamusi kuzorwa hondo iyi. Torai nzvimbo dzenyu; mumire makasimba mugoona kununurwa kwamuchapiwa naJehovha, imi Judha neJerusarema. Musatya; musaora mwoyo, endai mundovarwisa mangwana, uye Jehovha achava nemi.’”
18 Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya.
Jehoshafati akakotamisa chiso chake pasi uye vanhu vose veJudha neJerusarema vakawira pasi vachinamata pamberi paJehovha.
19 Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.
Ipapo vamwe vaRevhi kubva kuvaKohati navaKorahi vakasimuka vakarumbidza Jehovha, Mwari waIsraeri nenzwi guru kwazvo.
20 Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.”
Mangwanani-ngwanani vakaenda kuGwenga reTekoa. Vava kuenda, Jehoshafati akasimuka akati, “Teererai kwandiri, Judha navanhu veJerusarema! Tendai Jehovha Mwari wenyu ipapo muchasimbiswa; tendai vaprofita vake ipapo muchabudirira.”
21 Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
Shure kwokunge abvunzana navanhu, Jehoshafati akagadza varume kuti vaimbire Jehovha uye vamurumbidze nokuda kwokunaka kwoutsvene hwake pavaifamba vari mberi kwehondo, vachiti: “Vongai Jehovha, nokuti rudo rwake runogara nokusingaperi.”
22 Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
Pavakatanga kuimba vachirumbidza, Jehovha akaisa vavandiri kuti varwise varume veAmoni neMoabhu neveGomo reSeiri vaiuya kuzorwisa Judha, uye vakakundwa.
23 Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.
Varume veAmoni neMoabhu vakasimuka vakarwisa varume vaibva kuGomo reSeiri kuti vavaparadze zvachose. Vapedza kuuraya varume veSeiri vakaurayana pachavo.
24 Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.
Varume veJudha pavakasvika panzvimbo yakatarisana nerenje vakatarisa kwakanga kwaimbova nehondo huru vakangoona mitumbi yavanhu vakafa yakati rakata; hapana akapunyuka.
25 Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.
Saka Jehoshafati navanhu vake vakaenda kundotakura pfuma yavakanga vapamba, uye vakawana pakati pezvinhu izvi nhumbi dzakawanda nezvipfeko nemidziyo inokosha, yakawanda kupfuura zvavaikwanisa kutakura. Paiva nezvakapambwa zvakawanda kwazvo zvokuti vakapedza mazuva matatu vachingotakura.
26 Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
Pazuva rechina vakaungana muMupata weBheraka pavakarumbidza Jehovha. Ndokusaka uchiri kunzi Mupata weBheraka kusvikira nhasi.
27 Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
Ipapo vachitungamirirwa naJehoshafati, varume vose veJudha neJerusarema vakadzoka nomufaro kuJerusarema, nokuti Jehovha akanga avapa chikonzero chokufara pamusoro pavavengi vavo.
28 Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Vakapinda muJerusarema vakaenda kutemberi yaJehovha nembira nemitengeranwa nehwamanda.
29 Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
Kutya Mwari kwakauya pamadzimambo ose nenyika pavakanzwa kuti Jehovha akanga arwisa sei vavengi veIsraeri.
30 Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.
Uye nyika yaJehoshafati yakava norunyararo, nokuti Mwari wake akanga amupa zororo kumativi ose.
31 Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
Saka Jehoshafati akatonga Judha. Akanga ana makore makumi matatu namashanu paakava mambo weJudha, uye akatonga muJerusarema kwamakore makumi maviri namashanu. Mai vake vainzi Azubha mwanasikana waShiri.
32 O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
Akafamba nomunzira dzababa vake Asa uye haana kutsauka kubva madziri; akaita zvakanga zvakarurama pamberi paJehovha.
33 Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.
Asi nzvimbo dzakakwirira hadzina kubviswa uye vanhu havana kunge vaisa mwoyo yavo kuna Mwari wamadzibaba avo.
34 Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.
Mamwe mabasa okutonga kwaJehoshafati kubva pakutanga kusvikira pakupedzisira, akanyorwa mumashoko enhoroondo yaJehu mwanakomana waHanani, akanyorwa mubhuku ramadzimambo eIsraeri.
35 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ.
Mushure maizvozvi, Jehoshafati mambo weJudha akaita chitenderano naAhazia mambo weIsraeri uyo akanga akaipa kwazvo.
36 Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.
Akatenderana naye kuvaka zvikepe zvaizoenda kuTashishi. Mushure mokunge zvikepe izvi zvapera kuvakwa paEzioni Gebheri,
37 Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.
Eriezeri mwanakomana waDhodhavhahu, wokuMaresha akaprofita zvakaipa pamusoro paJehoshafati achiti, “Nokuti maita sungano naAhazia, Jehovha achaparadza zvamaita.” Zvikepe zvakaparadzwa uye hazvina kukwanisa kufamba kuenda kuTashishi.

< 2 Ihe E Mere 20 >