< 2 Ihe E Mere 2 >

1 Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze.
Now Solomon purposed to build a house for the name of the LORD, and a house for his kingdom.
2 O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ, na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii.
Solomon counted out seventy thousand men to bear burdens, and eighty thousand men who were stone cutters in the mountains, and three thousand and six hundred to oversee them.
3 Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya.
Solomon sent to Hiram the king of Tyre, saying, "As you dealt with David my father, and sent him cedars to build him a house in which to dwell, so deal with me.
4 Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.
Look, I am about to build a house for the name of the LORD my God, to dedicate it to him, and to burn before him incense of sweet spices, and for the continual show bread, and for the burnt offerings morning and evening, on the Sabbaths, and on the new moons, and on the set feasts of the LORD our God. This is an ordinance forever to Israel.
5 “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile.
"The house which I build is great; for our God is great above all gods.
6 Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?
But who is able to build him a house, since heaven and the heaven of heavens can't contain him? Who am I then, that I should build him a house, except just to burn incense before him?
7 “Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ.
"Now therefore send me a man skillful to work in gold, and in silver, and in bronze, and in iron, and in purple, and crimson, and blue, and who knows how to engrave engravings, to be with the skillful men who are with me in Judah and in Jerusalem, whom David my father provided.
8 “Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ,
"Send me also cedar trees, fir trees, and algum trees, out of Lebanon; for I know that your servants know how to cut timber in Lebanon: and look, my servants shall be with your servants,
9 ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma.
even to prepare me timber in abundance; for the house which I am about to build shall be great and wonderful.
10 Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”
Look, I will give to your servants, the cutters who cut timber, twenty thousand measures of beaten wheat, and twenty thousand measures of barley, and twenty thousand baths of wine, and twenty thousand baths of oil."
11 Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya. “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.”
Then Hiram the king of Tyre answered in writing, which he sent to Solomon, "Because the LORD loves his people, he has made you king over them."
12 Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.
Hiram continued, "Blessed be the LORD, the God of Israel, that made heaven and earth, who has given to David the king a wise son, endowed with discretion and understanding, that should build a house for the LORD, and a house for his kingdom.
13 “Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma.
Now I have sent a skillful man, endowed with understanding, Hiram Abi,
14 Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.
the son of a woman of the daughters of Dan; and his father was a man of Tyre, skillful to work in gold, and in silver, in bronze, in iron, in stone, and in timber, in purple, in blue, and in fine linen, and in crimson, also to engrave any kind of engraving, and to execute any design; that there may be a place appointed to him with your skillful men, and with the skillful men of my lord David your father.
15 “Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.
"Now therefore the wheat and the barley, the oil and the wine, which my lord has spoken of, let him send to his servants:
16 Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”
and we will cut wood out of Lebanon, as much as you shall need; and we will bring it to you in floats by sea to Joppa; and you shall carry it up to Jerusalem."
17 Emesịa, Solomọn gụrụ ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel ọnụ, dịka Devid mere, achọpụtara na ha dị narị puku iri ise na atọ, na narị isii.
Solomon numbered all the foreigners who were in the land of Israel, after the numbering with which David his father had numbered them; and they were found one hundred fifty-three thousand six hundred.
18 O mere iri puku ndị ọrụ asaa nʼime ha ka ha bụrụ ndị na-ebu ibu, na ọnụọgụgụ dị iri puku asatọ ka ha bụrụ ndị ga-awa nkume, meekwa puku ndị ikom atọ na narị isii, ndị ga-abụ ndịisi ọrụ ime ka ọrụ na-aga nke ọma.
He set seventy thousand of them to bear burdens, and eighty thousand who were stone cutters in the mountains, and three thousand six hundred overseers to set the people at work.

< 2 Ihe E Mere 2 >