< 2 Ihe E Mere 18 >

1 Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab.
Now Jehoshaphat had riches and honor in abundance, and joined affinity with Ahab.
2 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha.
And after certain years he went down to Ahab to Samaria. And Ahab killed sheep and oxen for him in abundance, and for the people that he had with him, and persuaded him to go up with him to Ramothgilead.
3 Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.”
And Ahab king of Israel said to Jehoshaphat king of Judah, Will you go with me to Ramothgilead? And he answered him, I am as you are, and my people as your people; and we will be with you in the war.
4 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka Onyenwe anyị.”
And Jehoshaphat said to the king of Israel, Inquire, I pray you, at the word of the LORD to day.
5 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.”
Therefore the king of Israel gathered together of prophets four hundred men, and said to them, Shall we go to Ramothgilead to battle, or shall I forbear? And they said, Go up; for God will deliver it into the king’s hand.
6 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
But Jehoshaphat said, Is there not here a prophet of the LORD besides, that we might inquire of him?
7 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
And the king of Israel said to Jehoshaphat, There is yet one man, by whom we may inquire of the LORD: but I hate him; for he never prophesied good to me, but always evil: the same is Micaiah the son of Imla. And Jehoshaphat said, Let not the king say so.
8 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
And the king of Israel called for one of his officers, and said, Fetch quickly Micaiah the son of Imla.
9 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
And the king of Israel and Jehoshaphat king of Judah sat either of them on his throne, clothed in their robes, and they sat in a void place at the entering in of the gate of Samaria; and all the prophets prophesied before them.
10 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’”
And Zedekiah the son of Chenaanah had made him horns of iron, and said, Thus says the LORD, With these you shall push Syria until they be consumed.
11 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
And all the prophets prophesied so, saying, Go up to Ramothgilead, and prosper: for the LORD shall deliver it into the hand of the king.
12 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
And the messenger that went to call Micaiah spoke to him, saying, Behold, the words of the prophets declare good to the king with one assent; let your word therefore, I pray you, be like one of theirs, and speak you good.
13 Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.”
And Micaiah said, As the LORD lives, even what my God says, that will I speak.
14 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.”
And when he was come to the king, the king said to him, Micaiah, shall we go to Ramothgilead to battle, or shall I forbear? And he said, Go you up, and prosper, and they shall be delivered into your hand.
15 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
And the king said to him, How many times shall I adjure you that you say nothing but the truth to me in the name of the LORD?
16 Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’”
Then he said, I did see all Israel scattered on the mountains, as sheep that have no shepherd: and the LORD said, These have no master; let them return therefore every man to his house in peace.
17 Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
And the king of Israel said to Jehoshaphat, Did I not tell you that he would not prophesy good to me, but evil?
18 Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị: Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
Again he said, Therefore hear the word of the LORD; I saw the LORD sitting on his throne, and all the host of heaven standing on his right hand and on his left.
19 Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
And the LORD said, Who shall entice Ahab king of Israel, that he may go up and fall at Ramothgilead? And one spoke saying after this manner, and another saying after that manner.
20 Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “Onyenwe anyị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’
Then there came out a spirit, and stood before the LORD, and said, I will entice him. And the LORD said to him, With which?
21 “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
And he said, I will go out, and be a lying spirit in the mouth of all his prophets. And the Lord said, You shall entice him, and you shall also prevail: go out, and do even so.
22 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
Now therefore, behold, the LORD has put a lying spirit in the mouth of these your prophets, and the LORD has spoken evil against you.
23 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
Then Zedekiah the son of Chenaanah came near, and smote Micaiah on the cheek, and said, Which way went the Spirit of the LORD from me to speak to you?
24 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
And Micaiah said, Behold, you shall see on that day when you shall go into an inner chamber to hide yourself.
25 Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze.
Then the king of Israel said, Take you Micaiah, and carry him back to Amon the governor of the city, and to Joash the king’s son;
26 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’”
And say, Thus says the king, Put this fellow in the prison, and feed him with bread of affliction and with water of affliction, until I return in peace.
27 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.”
And Micaiah said, If you certainly return in peace, then has not the LORD spoken by me. And he said, Listen, all you people.
28 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead.
So the king of Israel and Jehoshaphat the king of Judah went up to Ramothgilead.
29 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
And the king of Israel said to Jehoshaphat, I will disguise myself, and I will go to the battle; but put you on your robes. So the king of Israel disguised himself; and they went to the battle.
30 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
Now the king of Syria had commanded the captains of the chariots that were with him, saying, Fight you not with small or great, save only with the king of Israel.
31 Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na Onyenwe anyị nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ,
And it came to pass, when the captains of the chariots saw Jehoshaphat, that they said, It is the king of Israel. Therefore they compassed about him to fight: but Jehoshaphat cried out, and the LORD helped him; and God moved them to depart from him.
32 nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya.
For it came to pass, that, when the captains of the chariots perceived that it was not the king of Israel, they turned back again from pursuing him.
33 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.”
And a certain man drew a bow at a venture, and smote the king of Israel between the joints of the harness: therefore he said to his chariot man, Turn your hand, that you may carry me out of the host; for I am wounded.
34 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.
And the battle increased that day: however, the king of Israel stayed himself up in his chariot against the Syrians until the even: and about the time of the sun going down he died.

< 2 Ihe E Mere 18 >