< 2 Ihe E Mere 17 >

1 Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.
And Jehoshaphat his son reigned in his stead, and strengthened himself against Israel.
2 O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.
And he placed forces in all the fortified cities of Judah, and set garrisons in the land of Judah, and in the cities of Ephraim, which Asa his father had taken.
3 Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,
And the LORD was with Jehoshaphat, because he walked in the first ways of his father David, and sought not unto the Baalim;
4 kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
but sought to the God of his father, and walked in His commandments, and not after the doings of Israel.
5 Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
Therefore the LORD established the kingdom in his hand; and all Judah brought to Jehoshaphat presents; and he had riches and honour in abundance.
6 O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
And his heart was lifted up in the ways of the LORD; and furthermore he took away the high places and the Asherim out of Judah.
7 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
Also in the third year of his reign he sent his princes, even Ben-hail, and Obadiah, and Zechariah, and Nethanel, and Micaiah, to teach in the cities of Judah;
8 Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
and with them the Levites, even Shemaiah, and Nethaniah, and Zebadiah, and Asahel, and Shemiramoth, and Jehonathan, and Adonijah, and Tobijah, and Tob-adonijah, the Levites; and with them Elishama and Jehoram, the priests.
9 Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
And they taught in Judah, having the book of the Law of the LORD with them; and they went about throughout all the cities of Judah, and taught among the people.
10 Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.
And a terror from the LORD fell upon all the kingdoms of the lands that were round about Judah, so that they made no war against Jehoshaphat.
11 Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.
And some of the Philistines brought Jehoshaphat presents, and silver for tribute; the Arabians also brought him flocks, seven thousand and seven hundred rams, and seven thousand and seven hundred he-goats.
12 Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
And Jehoshaphat waxed great exceedingly; and he built in Judah castles and cities of store.
13 O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
And he had many works in the cities of Judah; and men of war, mighty men of valour, in Jerusalem.
14 Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha, Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ,
And this was the numbering of them according to their fathers' houses: of Judah, the captains of thousands: Adnah the captain, and with him mighty men of valour three hundred thousand;
15 onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ,
and next to him Jehohanan the captain, and with him two hundred and fourscore thousand;
16 ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ.
and next to him Amasiah the son of Zichri, who willingly offered himself unto the LORD, and with him two hundred thousand mighty men of valour;
17 Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ, ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
and of Benjamin: Eliada a mighty man of valour, and with him two hundred thousand armed with bow and shield;
18 Onye ọzọ bụ Jehozabad, onye na-achị narị puku ndị agha na iri puku asatọ, ndị jikeere ibu agha.
and next to him Jehozabad, and with him a hundred and fourscore thousand ready prepared for war.
19 Ndị a bụ ndị ikom na-ejere eze ozi, nʼagụnyeghị ndị ahụ o tinyere ka ha nọdụ nʼobodo niile e wusiri ike dị nʼime Juda.
These were they that waited on the king beside those whom the king put in the fortified cities throughout all Judah.

< 2 Ihe E Mere 17 >