< 2 Ihe E Mere 17 >
1 Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.
Yehosafati mwana wake analowa ufumu mʼmalo mwake ndipo anadzilimbitsa pofuna kulimbana ndi Israeli.
2 O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.
Iye anayika magulu a asilikali mʼmizinda yonse yotetezedwa ya Yuda, ndipo anamanga maboma mu Yuda ndi mʼmizinda yonse ya Efereimu imene Asa abambo ake analanda.
3 Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,
Yehova anali ndi Yehosafati chifukwa mʼzaka zoyambirira anatsatira makhalidwe a Davide abambo ake. Iye sanafunsire kwa Abaala.
4 kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
Koma anafunafuna Mulungu wa abambo ake ndipo anatsatira malamulo ake osati zochita za Israeli.
5 Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
Yehova anakhazikitsa kolimba ufumuwo mʼmanja mwake ndipo Ayuda onse anabweretsa mphatso kwa Yehosafati, kotero kuti anali ndi chuma ndi ulemu wambiri.
6 O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
Mtima wake anawupereka kutsatira Yehova, kuwonjezera apo, anachotsa malo onse achipembedzo ndi mafano a Asera mu Yuda.
7 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
Mʼchaka chachitatu cha ufumu wake, iye anatuma akuluakulu ake Beni-Haili, Obadiya, Zekariya, Netaneli ndi Mikaya kukaphunzitsa mʼmizinda ya Yuda.
8 Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
Pamodzi ndi iwo panali Alevi ena: Semaya, Netaniya, Zebadiya, Asaheli, Semiramoti, Yonatani, Adoniya, Tobiya ndi Tobu-Adoniya ndiponso ansembe Elisama ndi Yehoramu.
9 Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
Iwo anaphunzitsa mu Yuda monse atatenga Buku la Malamulo a Yehova iwo anayenda mʼmizinda yonse ya ku Yuda ndipo anaphunzitsa anthu.
10 Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.
Kuopsa kwa Yehova kunali pa maufumu onse a mayiko oyandikana ndi Yuda, kotero kuti sanachite nkhondo ndi Yehosafati.
11 Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.
Afilisti ena anabweretsa kwa Yehosafati mphatso ndi siliva ngati msonkho, ndipo Aarabu anabweretsa ziweto: nkhosa zazimuna 7,700 ndi mbuzi 7,700.
12 Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
Mphamvu za Yehosafati zinkakulirakulira. Iye anamanga malo otetezedwa ndi mizinda yosungiramo chuma mu Yuda
13 O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
ndipo anali ndi katundu wambiri mʼmizinda ya Yuda. Iye anayikanso asilikali odziwa bwino nkhondo mu Yerusalemu.
14 Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha, Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ,
Chiwerengero chawo potsata mabanja awo chinali chotere: kuchokera ku Yuda, atsogoleri a magulu 1,000; mtsogoleri Adina, anali ndi anthu 300,000 odziwa nkhondo;
15 onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ,
otsatana naye, mtsogoleri Yehohanani, anali ndi anthu 280,000;
16 ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ.
otsatana naye, Amasiya mwana wa Zikiri amene anadzipereka yekha kutumikira Yehova, anali ndi anthu 200,000.
17 Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ, ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
Kuchokera ku Benjamini: Eliada, msilikali wolimba mtima, anali ndi anthu 200,000 amene anali ndi mauta ndi zishango;
18 Onye ọzọ bụ Jehozabad, onye na-achị narị puku ndị agha na iri puku asatọ, ndị jikeere ibu agha.
otsatana naye, Yehozabadi, anali ndi anthu 180,000 okonzekera nkhondo.
19 Ndị a bụ ndị ikom na-ejere eze ozi, nʼagụnyeghị ndị ahụ o tinyere ka ha nọdụ nʼobodo niile e wusiri ike dị nʼime Juda.
Awa ndi anthu amene ankatumikira mfumu osawerengera amene anawayika mʼmizinda yotetezedwa mʼdziko lonse la Yuda.