< 2 Ihe E Mere 15 >
1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
UMoya kaNkulunkulu wasesehlela phezu kukaAzariya indodana kaOdedi.
2 Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
Wasephuma ukuhlangabezana loAsa, wathi kuye: Ngilalela, Asa loJuda wonke loBhenjamini; iNkosi ilani liselayo. Uba-ke liyidinga, izafunyanwa yini; kodwa uba liyilahla, izalilahla.
3 Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
Okwensuku ezinengi uIsrayeli wayengelaye uNkulunkulu weqiniso, njalo engelaye umpristi ofundisayo, njalo engelawo umlayo.
4 Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.
Kodwa ekubandezelweni kwakhe waphendukela eNkosini, uNkulunkulu kaIsrayeli, basebemdinga, wasefunyanwa yibo.
5 Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
Langalezozikhathi kwakungelakuthula kophumayo lakongenayo, ngoba inhlupheko ezinengi zaziphezu kwabo bonke abakhi bamazwe.
6 Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.
Basebephahlazwa, isizwe ngesizwe, lomuzi ngomuzi, ngoba uNkulunkulu wabahlupha ngayo yonke imbandezelo.
7 Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
Ngakho lina qinani, zingadangali izandla zenu, ngoba kulomvuzo ngomsebenzi wenu.
8 Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Lapho uAsa esizwa lamazwi lesiprofetho sikaOdedi umprofethi, waziqinisa, wasusa izinengiso elizweni lonke lakoJuda loBhenjamini lemizini ayeyithumbile entabeni yakoEfrayimi, wavuselela ilathi leNkosi elalingaphambi kwekhulusi leNkosi.
9 Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
Wasebuthanisa wonke uJuda loBhenjamini labemzini labo ababevela koEfrayimi loManase lakoSimeyoni; ngoba bawelela kuye bevela koIsrayeli ngobunengi lapho bebona ukuthi iNkosi uNkulunkulu wakhe yayilaye.
10 Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
Basebebuthana eJerusalema ngenyanga yesithathu ngomnyaka wetshumi lanhlanu wokubusa kukaAsa.
11 Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
Basebehlabela iNkosi ngalolosuku okwempango ababeyilethile, inkabi ezingamakhulu ayisikhombisa lezimvu ezizinkulungwane eziyisikhombisa.
12 Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.
Basebengena esivumelwaneni sokudinga iNkosi, uNkulunkulu waboyise, ngenhliziyo yabo yonke langomphefumulo wabo wonke.
13 Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.
Njalo wonke ongadingi iNkosi uNkulunkulu kaIsrayeli uzabulawa, kusukela komncinyane kusiya komkhulu, kusukela kowesilisa kusiya kowesifazana.
14 Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.
Basebefunga eNkosini ngelizwi elikhulu langokumemeza langezimpondo langempondo zezinqama.
15 Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
AbakoJuda bonke bathokoza-ke ngesifungo, ngoba babefungile ngenhliziyo yabo yonke, beyidingile ngaso sonke isifiso sabo, yasifunyanwa yibo; ngakho iNkosi yabaphumuza inhlangothi zonke.
16 Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
Njalo mayelana loMahaka unina kaAsa inkosi, yamsusa ekubeni yindlovukazi, ngoba wayenzele isixuku into enengekayo. UAsa wasegamula into yakhe enengekayo, wayichola, wayitshisela esifuleni iKidroni.
17 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
Kanti indawo eziphakemeyo kazisuswanga koIsrayeli; lanxa kunjalo inhliziyo kaAsa yayiphelele insuku zakhe zonke.
18 O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
Wasengenisa endlini kaNkulunkulu izinto ezingcwele zikayise, lezinto zakhe ezingcwele, isiliva legolide lezitsha.
19 Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.
Kakusabanga khona impi kwaze kwaba ngumnyaka wamatshumi amathathu lanhlanu wokubusa kukaAsa.