< 2 Ihe E Mere 14 >

1 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya.
So Abijah slept with his fathers, and they buried him in the City of David; and Asa his son reigned in his place. In his days the land was quiet ten years.
2 Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
Asa did that which was good and right in the eyes of the LORD his God:
3 Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera.
for he took away the foreign altars, and the high places, and broke down the pillars, and cut down the Asherim,
4 O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile.
and commanded Judah to seek the LORD, the God of their fathers, and to do the law and the commandment.
5 O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.
Also he took away out of all the cities of Judah the high places and the sun images: and the kingdom was quiet before him.
6 O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.
He built fortified cities in Judah; for the land was quiet, and he had no war in those years, because the LORD had given him rest.
7 Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.
For he said to Judah, "Let us build these cities, and make walls around them, with towers, gates, and bars. The land is still ours. Since we have sought the LORD our God, he has sought us and he has given us rest on every side." So they built and prospered.
8 Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike.
Asa had an army that bore bucklers and spears, out of Judah three hundred thousand; and out of Benjamin, that bore shields and drew bows, two hundred eighty thousand: all these were mighty men of valor.
9 Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha.
There came out against them Zerah the Ethiopian with an army of a million troops, and three hundred chariots; and he came to Mareshah.
10 Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso.
Then Asa went out to meet him, and they set the battle in array in the Valley of Zephathah at Mareshah.
11 Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”
Asa cried to the LORD his God, and said, "LORD, there is none besides you to help, between the mighty and those who have no strength. Help us, LORD our God; for we rely on you, and in your name we have come against this multitude. LORD, you are our God. Do not let man prevail against you."
12 Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ.
So the LORD struck the Ethiopians before Asa, and before Judah; and the Ethiopians fled.
13 Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu Onyenwe anyị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche.
Asa and the people who were with him pursued them to Gerar: and there fell of the Ethiopians so many that they could not recover themselves; for they were destroyed before the LORD, and before his army; and they carried away very much booty.
14 Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ.
They struck all the cities around Gerar; for the fear of the LORD came on them: and they plundered all the cities; for there was a great amount of plunder in them.
15 Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.
They struck also the tents of livestock, and carried away sheep in abundance, and camels, and returned to Jerusalem.

< 2 Ihe E Mere 14 >