< 2 Ihe E Mere 13 >

1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam.
Abijah became king of Judah in the eighteenth year of the reign of Jeroboam.
2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea. Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
He reigned in Jerusalem for three years. His mother's name was Micaiah, daughter of Uriel—she was from Gibeah. Abijah and Jeroboam were at war.
3 Abija họpụtara ndị ya dị ike nʼagha bụ ndị ọnụọgụgụ ha dị narị puku anọ, ma Jeroboam eze Izrel họpụtara ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku asatọ doo ha nʼusoro.
Abijah went out to fight with an army of 400,000 brave warriors, while Jeroboam opposed him with his army of 800,000 chosen warriors of great strength.
4 Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị!
Abijah stood on Mount Zemaraim, in the hill country of Ephraim, and said, “Listen to me, Jeroboam and all of Israel!
5 Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?
Don't you understand that the Lord, the God of Israel, gave the kingdom of Israel to David and his descendants forever by a binding agreement?
6 Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.
Yet Jeroboam, son of Nebat, just a servant of Solomon, son of David, had the audacity to rebel against his master.
7 Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.
Then some good-for-nothing evil men gathered round him and defied Rehoboam, son of Solomon, when he was young and inexperienced, and couldn't confront them.
8 “Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.
Now do you really think you can oppose the kingdom of the Lord, held by David's descendants? You may be a large horde, and have with you the golden calves that Jeroboam made for you as gods.
9 Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.
But didn't you drive out the priests of the Lord, Aaron's descendants, and the Levites, and make priests for yourselves just like people in other nations do? Now anyone who wants to can come and dedicate himself, sacrificing a young bull and seven rams, and he can become a priest of things that really are not gods.
10 “Ma banyere anyị, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere Onyenwe anyị ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka.
But for us, the Lord is our God! We have not abandoned him. We have priests serving the Lord who are descendants of Aaron, and we have Levites who help them in their ministry.
11 Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.
Morning and evening they present burnt offerings and burn fragrant incense to the Lord. They place the rows of showbread on the purified table, and light the lamps of the gold lampstand every evening. We are doing what the Lord our God told us to do, while you have abandoned him.
12 Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”
God is leading us! His priests blow their trumpets to go into battle against you. People of Israel, don't fight against the Lord, the God of your fathers, for you won't win!”
13 Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ.
But Jeroboam had sent troops around to attack from the rear, so that while he and the main force was in front of Judah, the ambush was behind them.
14 Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.
Judah turned around and realized that they were having to fight front and rear. They cried out to the Lord for help. Then the priests blew their trumpets,
15 Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.
and the men of Judah gave a loud shout. When they shouted, God struck Jeroboam and all Israel in front of Abijah and Judah.
16 Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.
The Israelites ran away from Judah, and God handed them over to Judah, defeated.
17 Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.
Abijah and his men hit them hard, and 500,000 of Israel's best warriors were killed.
18 Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.
So the Israelites were subdued at that time, and the people of Judah were victorious because they relied on the Lord, the God of their forefathers.
19 Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
Abijah chased Jeroboam and captured some towns from him: Bethel, Jeshanah, and Ephron, along with their villages.
20 Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya Onyenwe anyị tidara ya tigbuo ya.
Jereboam never regained his power during Abijah's reign. Eventually the Lord struck him down and he died.
21 Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii.
But Abijah grew stronger and stronger. He married fourteen wives and had twenty-two sons and sixteen daughters.
22 Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.
The rest of what Abijah did—what he said and what he accomplished—is recorded in the history written by Iddo the Prophet.

< 2 Ihe E Mere 13 >