< 2 Ihe E Mere 11 >
1 Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam.
Ikawa Rehoboamu alipofika Yerusalemu, akakusanya nyumba ya Yuda na ya Benyamini, wanaume wapiganaji 180,000, kufanya vita dhidi ya nyumba ya Israeli na kuurudisha tena ufalme kwa Rehoboamu mwana wa Solomoni.
2 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
Lakini neno hili la Bwana likamjia Shemaya mtu wa Mungu:
3 “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
“Mwambie Rehoboamu mwana wa Solomoni mfalme wa Yuda, na Israeli wote walioko Yuda na Benyamini,
4 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
‘Hili ndilo asemalo Bwana: Msipande kupigana dhidi ya ndugu zenu. Nendeni nyumbani, kila mmoja wenu, kwa kuwa hili nimelitenda mimi.’” Kwa hiyo wakalitii neno la Bwana na wakaacha kwenda kupigana dhidi ya Yeroboamu.
5 Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
Rehoboamu akaishi Yerusalemu akajenga miji yenye ngome katika Yuda:
6 Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
Akajenga Bethlehemu, Etamu, Tekoa,
Beth-Suri, Soko, Adulamu,
9 na Adoraim, Lakish, Azeka
Adoraimu, Lakishi, Azeka,
10 Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike.
Sora, Aiyaloni na Hebroni. Hii ndiyo iliyokuwa miji iliyojengewa ngome katika Yuda na Benyamini.
11 O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya.
Akaimarisha ulinzi wake na kuweka majemadari ndani yake, pamoja na ghala za mahitaji ya vyakula, mafuta ya zeituni na divai.
12 O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.
Akaweka ngao na mikuki katika miji na kuifanya iwe imara sana. Kwa hiyo Yuda na Benyamini zikawa zake.
13 Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.
Makuhani na Walawi kutoka sehemu zote za Israeli wakawa upande wake.
14 Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.
Pia Walawi wakaacha maeneo yao ya malisho na mali zao, wakaja Yuda na Yerusalemu kwa sababu Yeroboamu na wanawe walikuwa wamewakataa wasiwe makuhani wa Bwana.
15 Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.
Naye akawa amechagua makuhani wake mwenyewe kwa ajili ya mahali pa juu pa kuabudia sanamu za mbuzi na za ndama ambazo alikuwa ametengeneza.
16 Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.
Wale waliotoka katika kila kabila la Israeli ambao walielekeza mioyo yao kumtafuta Bwana, Mungu wa Israeli, wakawafuata Walawi huko Yerusalemu kumtolea Bwana dhabihu, Mungu wa baba zao.
17 Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
Wakaimarisha ufalme wa Yuda na kumuunga mkono Rehoboamu mwana wa Solomoni miaka mitatu, wakienenda katika njia za Daudi na Solomoni katika wakati huu.
18 Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.
Rehoboamu alimwoa Mahalati ambaye alikuwa binti Yeremothi mwana wa Daudi, mamaye alikuwa Abihaili binti Eliabu mwana wa Yese.
19 Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
Mahalati alimzalia Rehoboamu wana: Yeushi, Shemaria na Zahamu.
20 Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
Kisha akamwoa Maaka binti Absalomu, ambaye alimzalia: Abiya, Atai, Ziza na Shelomithi.
21 Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
Rehoboamu akampenda Maaka binti Absalomu zaidi kuliko wakeze wengine na masuria wake. Kwa jumla alikuwa na wake kumi na wanane na masuria sitini, wana ishirini na wanane na binti sitini.
22 Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
Rehoboamu akamweka Abiya mwana wa Maaka, kuwa mkuu wa wana wa mfalme miongoni mwa ndugu zake ili amfanye mfalme.
23 O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.
Akatenda kwa busara, akiwasambaza baadhi ya wanawe katika wilaya zote za Yuda na Benyamini, pamoja na miji yote yenye ngome. Akawapa mahitaji tele na kuwaoza wake wengi.