< 2 Ihe E Mere 10 >

1 Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze.
Rehoboam went to Shechem, for all Israel was coming to Shechem to make him king.
2 Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta.
When Jeroboam the son of Nebat heard this (for he was in Egypt, where he had fled from King Solomon), he returned from Egypt.
3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:
So they sent and called him, and Jeroboam and all Israel came; they spoke to Rehoboam and said,
4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
“Your father made our yoke difficult. Now therefore, make your father's hard work easier, and lighten the heavy yoke that he put on us, and we will serve you.”
5 Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
Rehoboam said to them, “Come again to me after three days.” So the people left.
6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
King Rehoboam consulted with the old men who had stood before Solomon his father while he was alive; he said, “How would you advise me to bring an answer to these people?”
7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”
They spoke to him and said, “If you are good to this people and please them, and say good words to them, then they will always be your servants.”
8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.
But Rehoboam ignored the advice of the old men that they had given him, and consulted with the young men who had grown up with him, who stood before him.
9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’?”
He said to them, “What advice do you give me, so that we may answer the people who spoke to me and said, 'Lighten the yoke that your father put on us'?”
10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.
The young men who had grown up with Rehoboam spoke to him, saying, “This is how you should speak to the people who told you that your father Solomon made their yoke heavy, but that you must make it lighter. This is what you should say to them, 'My little finger is thicker than my father's waist.
11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’”
So now, although my father burdened you with a heavy yoke, I will add to your yoke. My father punished you with whips, but I will punish you with scorpions.'”
12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”
So Jeroboam and all the people came to Rehoboam on the third day, as the king said, “Come back to me on the third day.”
13 Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye
Rehoboam spoke to them harshly, ignoring the advice of the old men.
14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.”
He spoke to them following the advice of the young men, saying, “My father made your yoke heavy, but I will add to it. My father punished you with whips, but I will punish you with scorpions.”
15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
So the king did not listen to the people, for it was a turn in events brought about by God, that Yahweh might carry out his word that Ahijah the Shilonite had spoken to Jeroboam son of Nebat.
16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha.
When all Israel saw that the king did not listen to them, the people answered him and said, “What share do we have in David? We have no inheritance in the son of Jesse! Each of you should go back to his tent, Israel. Now see to your own house, David.” So all Israel returned to their tents.
17 Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
But as for the people of Israel who lived in the cities of Judah, Rehoboam reigned over them.
18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye ma ndị Izrel ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem.
Then King Rehoboam sent Adoniram, who was over the forced laborers, but the people of Israel stoned him to death with stones. King Rehoboam fled quickly in his chariot to Jerusalem.
19 Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.
So Israel has been in rebellion against the house of David to this day.

< 2 Ihe E Mere 10 >