< 1 Timoti 6 >

1 Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị.
Let as many servants as are under the yoke count their own masters worthy of all honour, that the name of God and [his] doctrine be not blasphemed.
2 Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a.
And they that have believing masters, let them not despise [them], because they are brethren; but rather do [them] service, because they are faithful and beloved, partakers of the benefit. These things teach and exhort.
3 Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke,
If any man teach otherwise, and consent not to wholesome words, [even] the words of our Lord Jesus Christ, and to the doctrine which is according to godliness;
4 bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche,
He is proud, knowing nothing, but doting about questions and strifes of words, whereof cometh envy, strife, railings, evil surmisings,
5 na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.
Perverse disputings of men of corrupt minds, and destitute of the truth, supposing that gain is godliness: from such withdraw thyself.
6 Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.
But godliness with contentment is great gain.
7 Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ.
For we brought nothing into [this] world, [and it is] certain we can carry nothing out.
8 Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.
And having food and raiment let us be therewith content.
9 Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.
But they that will be rich fall into temptation and a snare, and [into] many foolish and hurtful lusts, which drown men in destruction and perdition.
10 Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.
For the love of money is the root of all evil: which while some coveted after, they have erred from the faith, and pierced themselves through with many sorrows.
11 Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
But thou, O man of God, flee these things; and follow after righteousness, godliness, faith, love, patience, meekness.
12 Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. (aiōnios g166)
Fight the good fight of faith, lay hold on eternal life, where unto thou art also called, and hast professed a good profession before many witnesses. (aiōnios g166)
13 Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu
I give thee charge in the sight of God, who quickeneth all things, and [before] Christ Jesus, who before Pontius Pilate witnessed a good confession;
14 ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe.
That thou keep [this] commandment without spot, unrebukeable, until the appearing of our Lord Jesus Christ:
15 Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
Which in his times he shall shew, [who is] the blessed and only Potentate, the King of kings, and Lord of lords;
16 Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen. (aiōnios g166)
Who only hath immortality, dwelling in the light which no man can approach unto; whom no man hath seen, nor can see: to whom [be] honour and power everlasting. Amen. (aiōnios g166)
17 Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. (aiōn g165)
Charge them that are rich in this world, that they be not highminded, nor trust in uncertain riches, but in the living God, who giveth us richly all things to enjoy; (aiōn g165)
18 Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere.
That they do good, that they be rich in good works, ready to distribute, willing to communicate;
19 Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru.
Laying up in store for themselves a good foundation against the time to come, that they may lay hold on eternal life.
20 Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma,
O Timothy, keep that which is committed to thy trust, avoiding profane [and] vain babblings, and oppositions of science falsely so called:
21 bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo. Ka amara dịnyere gị. Amen.
Which some professing have erred concerning the faith. Grace [be] with thee. Amen.

< 1 Timoti 6 >