< 1 Timoti 4 >
1 Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.
Now the Spirit says expressly, that, in the last times, some shall depart from the faith, giving heed to seducing spirits, and teachings suggested by demons,
2 Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha.
through the hypocrisy of liars, who are seared in their conscience,
3 Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.
who forbid to marry, and command to abstain from meats, which God has created to be received with thanksgiving by those who believe, and know the truth.
4 Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,
For every creature of God is good, and nothing is to be rejected, if it be received with thanksgiving;
5 nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
for it is sanctified by the word of God, and by prayer.
6 Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.
By recommending these things to the attention of the brethren, you will be a good minister of Jesus Christ, being nourished with the words of the faith, and of good teaching, which you have fully known.
7 Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke.
But reject those profane and old-womanish fables, and exercise yourself for godliness.
8 Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.
For the exercise of the body is profitable for little; but godliness is profitable for all things, and has the promise of the life that now is, and also of that which is to come.
9 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.
This is a true saying, and worthy of all acceptation:
10 Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.
for to this end we both labor, and suffer reproach, because we trust in the living God, who is the Savior of all men, especially of those who believe.
11 Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.
These things command and teach.
12 Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.
Let no one despise your youth; but be an example to the believers, in word, in behavior, in love, in spirit, in faithfulness, in purity.
13 Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.
Till I come, give attention to reading, to exhortation, to teaching.
14 Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.
Neglect not the gift that is in you, which was given you according to prophecy, with the laying on of the hands of the eldership.
15 Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.
Meditate upon these things; give yourself wholly to them, that your advancement may be manifest in all things.
16 Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.
Take heed to yourself, and to your teaching; continue in them; for by doing this, you will save both yourself, and those who hear you.