< 1 Timoti 4 >

1 Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.
Ruhu hla ni ra du ivi u' kle kle ndi bari ba yab shishi ni bangaskiya da ya suron mba ni ruhahi bi qru ni tsro u ibrji.
2 Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha.
Ni mi ce ni meme mre ani kle.
3 Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.
Ba zu ndi duba na gra na da na kpa biri wa Rji ti ni grie na ni bi wa ba kpa yeim da toh jaji.
4 Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,
Naki ikpie wa trji ti a didi ma. Tkpie wa ki kpa wawu'u ni grie, duba na kamba ni'u'na.
5 nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
Nakima ba gla u' nitre Rji nibre.
6 Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.
Inde u' no mir vayi mere rkpie bi yi u' zama gran didima'u Almasihu don basi me u ni tu tre bangaskiya ni tsro wa u' hu'a.
7 Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke.
Na yo ton di wo cholonchon u gbugbulu wa cice mba ba so na, nakima wu ka hari tume di hu Rji.
8 Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.
Nakima horo u kpa ahei ni amfani fi me yi, aman horo ni mi hu Rji a hei ni amfani ni kpie wawo'u ni mi ma ahei ni yo yeiu ni rayuwa ni rayuwa u ye.
9 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.
Nakima itre yi a jaji wa ba kpa wawu'u.
10 Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.
A kimasa du ta ni tidu susai, don ki yo suron ni Rji wandi ani vri ni kpa ndi chuwo wawu'u musama biwo ba kpa yeim ni wu.
11 Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.
Nakima wuka hla di bla kpie bi yi ni bawu.
12 Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.
Na kpa yeim du dio kpa inze me tsir na naki ma wuka zama wa ba yi koyi ni bi hu ni tre, na hali ni son nididi, nikuma yeryer.
13 Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.
Sei miye, yo tu di bla, di wa tre a di tsro.
14 Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.
Na kpa baiwa wa ahei ni wu tsir na, wa ba no ni annabci wa bi cice ndi ba vu wo sa ni wu.
15 Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.
Mla kpie bi yi jin di du guci me du zama wa ndi ba wawu'u baka toh ni shishi mba.
16 Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.
Mla tume ti ni koyarwa me di guci ni mi kpi bi yi, nakima wu'u kpa tume cuwo ni bi wa ba zi wo'u

< 1 Timoti 4 >