< 1 Timoti 3 >
1 Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma.
Вірне слово: коли хто єпископства хоче, доброго діла бажає.
2 Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.
Треба ж єпископу бути непорочним, однієї жінки чоловіком, тверезим, цїломудрим, чесним, гостинним, навчаючим,
3 Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya.
не пяницею, не до бійки, не до здирства, а тихим, несварливим, не сріблолюбцем,
4 Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla.
своїм домом щоб добре правив, дітей держав у слухняності з усякою повагою;
5 (Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?)
(Коли бо хто своїм домом не вміє правити, то як йому про церкву Божу дбати?)
6 Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu.
не новохрищеним, щоб розгордившись не впав у суд дияволський.
7 Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
Треба ж йому і сьвідкуваннє добре мати від остороннїх, щоб не впав у ганьбу та в тенета дияволські.
8 Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi.
Дияконам так само (треба бути) чесним, не двоязичним, щоб не вживали багато вина, не здирствовали,
9 Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
мали тайну віри в чистій совісті.
10 Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
І про таких же (треба) перше впевнитись, а потім нехай служять, бувши непорочними.
11 Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.
Жінкам (їх) так само (треба бути) чесним, не до осуди, тверезим, вірним у всьому.
12 Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma.
Диякони що б бували однієї жінки чоловіками, дїтьми добре правлячи і своїми домами.
13 Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.
Бо хто добре дияконував, степень собі добрий здобував і велику одвагу у вірі, що в Христї Ісусї.
14 Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a.
Се пишу тобі, уповаючи прийти до тебе скоро;
15 Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.
коли ж загаюсь, що б ти знав, як треба в дому Божому жити, котрий єсть церква Бога живого, стовп і утвердженнє правди.
16 Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.
І справдї велика се тайна благочестя: Бог явив ся в тїлї, справдивсь у Дусї, показав ся ангелам, проповідано Його між поганами, увірували в Його по сьвіту, вознїс ся в славі.