< 1 Timoti 2 >
1 Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,
Kuite gwa ung'wandyo nuaaya ehi, inonee malompi nedua, nemaombezi, nilumbi atendeke kunsoko aantu ehi,
2 kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ.
kunsoko atemi nawa ehi niakete uuhumi, kina kuhumekikie mulikalo nulaupolo nuukilagi muuhueli wihi nikulyo.
3 Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.
Ile iza hange legombekili ntongeela ang'wi Tunda muguni witu.
4 Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.
Insula akwe nuanso iantu eki aguneke hange alinge itai.
5 Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.
Kunsoko ukole Itunda ungwi, hange ukole muhungi ung'we nung'wi Tunda nukuantu inge u Yesu Kilisto.
6 Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.
Aewipumilye ung'wenso anga mukomoli kuaehi, anga muheng'wa kumatungo napikile.
7 Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.
Kunsoko eye, une unene aentendilwe numutuungwa nuankani ninziza hange numitumi, kutambula itai. Singakutambula iuiteele. Une nimumanyisi waantu nianyakilungu muuhueli nuatai.
8 Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka.
Inge gwa, ntakile iagoha kela kianza alompe nukuhumbula imikono ezekutile anga ikuo nukuailya.
9 Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.
Uu uu, ntakile iasungu ikunekile eang'wenda negombekile, kikulyo nukigilya. Ezeagila imasingi nasukile, ang'wi zahabu, ang'wi lutu, ang'wi angwenda niansailo nkulu.
10 Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.
Hange nakile atugale iang'wenda niakuakumbaiasungu niitambule uuchaji kukeila intendo niza.
11 Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.
Umusungu nuamanye mukianza kaukulu hange nukugomba ehi.
12 Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ.
Singa numugombilye umusungu kumanyisa, ang'wi kutula nuuhumi kumogohekwe inge wikie nukianza kaukilaji.
13 Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.
Kunsoko uadamu aeuumbilwe ng'wandyo, ueva wikimalinkilya.
14 Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu.
Uadamu singaaukongewe, kuite umusungu aukongewe lukulu nukupiluka.
15 Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.
Ata uu, ukugunwa kukiela kutuga eana, ang'wi akulongoleka muuhueli nuulowa hange numuogigwi nimahala nimaza.