< 1 Ndị Tesalonaịka 1 >
1 Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu.
Milí bratři, vám všem v Tesalonice, kteří jste ve spojení s Ježíšem Kristem, naším Pánem, a s Bohem, jeho Otcem, posíláme spolu se Silvánem a Timotejem přání Boží milosti a pokoje.
2 Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị.
V každé naší modlitbě za vás děkujeme.
3 Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Připomínáme si vaše láskyplné skutky, vaši pevnou víru a trpělivé očekávání Pána Ježíše Krista.
4 Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu.
Víme, milovaní, že si vás Bůh vyvolil, abyste se stali jeho dětmi. Když jsme vám tlumočili radostné Boží poselství, přijali jste ho s nepředstíraným zájmem.
5 Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.
Naše kázání na vás hluboce zapůsobila, protože Boží Duch stál při nás a dával nám odvahu a našim slovům přesvědčivost.
6 Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu.
Tak jste se stali našimi a Kristovými učedníky a vzdor všem nesnázím vás teď Duch svatý naplňuje radostí,
7 Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa.
takže jste vzorem i ostatním křesťanům po celé Makedonii a Acháji.
8 Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya.
Nejenom tam se však vaší zásluhou dostalo Kristovo poselství. Kamkoliv přijdeme, všude nám vyprávějí – dřív než se sami dostaneme ke slovu –, že jste nalezli pravého Boha.
9 Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke,
Každý hovoří o tom, jak jste nás přijali, jak jste se od svých model obrátili, abyste sloužili Bohu živému a skutečnému,
10 na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.
a jak očekáváte příchod jeho Syna Ježíše, kterého Bůh vzkřísil a v němž je naše jediná záchrana před blížícím se soudem.