< 1 Ndị Tesalonaịka 4 >

1 Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa.
Nadalje vas potem rotimo, bratje in vas spodbujamo po Gospodu Jezusu, da kakor ste od nas prejeli, kako bi morali živeti in ugajati Bogu, tako da bi bili bolj in bolj obilni.
2 Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.
Kajti veste, kakšne zapovedi smo vam dali po Gospodu Jezusu.
3 Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,
Kajti to je Božja volja, celó vaše posvečenje, da naj bi se vzdržali pred prešuštvovanjem,
4 ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ.
da bi vsakdo izmed vas vedel, kako čuvati svojo posodo v posvečenju in časti;
5 Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.
ne [pa] v poželenju pohotnosti, tako kakor pogani, ki ne poznajo Boga;
6 Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.
da noben človek ne gre preko in ne goljufa svojega brata v katerikoli zadevi; zato ker je Gospod maščevalec vsega tega, kakor smo vas tudi mi svarili in pričevali.
7 Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ.
Kajti Bog nas ni poklical k nečistosti, temveč v svetost.
8 Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.
Kdor torej prezira, ne prezira človeka, temveč Boga, ki nam je prav tako dal svojega Svetega Duha.
9 Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ.
Toda glede bratoljúbja ne potrebujete, da vam pišem, kajti vi sami ste od Boga poučeni, da ljubite drug drugega.
10 Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a.
In zares to delajte do vseh bratov, ki so po vsej Makedoniji. Toda rotimo vas, bratje, da bolj in bolj rastete
11 Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,
in da se učite biti mirni ter opravljati svoje lastno opravilo in da delate s svojimi lastnimi rokami, kakor smo vam zapovedali;
12 nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.
da boste lahko živeli iskreno do teh, ki so zunaj in da ne boste ničesar potrebovali.
13 Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya.
Toda ne želim, da bi bili vi nevedni, bratje, glede teh, ki so zaspali, da ne žalujete, tako kakor drugi, ki nimajo upanja.
14 Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.
Kajti če verujemo, da je Jezus umrl in ponovno vstal, bo točno tako tudi tiste, ki spijo v Jezusu, Bog privedel z njim.
15 Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ.
Kajti to vam rečemo po Gospodovi besedi, da mi, ki smo živi in ostanemo do Gospodovega prihoda, ne bomo vodili teh, ki so zaspali.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie.
Kajti sam Gospod se bo spustil iz nebes z vzklikom, z glasom nadangela in z Božjo trobento; in prvi bodo vstali mrtvi v Kristusu.
17 Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
Potem pa bomo mi, ki smo živi in preostanemo, vzeti skupaj z njimi v oblake, da srečamo Gospoda v zraku, in tako bomo vedno z Gospodom.
18 Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.
Zato drug drugega tolažite s temi besedami.

< 1 Ndị Tesalonaịka 4 >