< 1 Samuel 1 >

1 O nwere otu nwoke onye Zuf, si na Ramataim, nʼala ugwu ugwu Ifrem. Aha ya bụ Elkena nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Ifrem.
Ọkùnrin kan wà, láti Ramataimu-Sofimu, láti ìlú olókè Efraimu, ẹni tí orúkọ rẹ̀ ń jẹ́ Elkana, ọmọ Jerohamu, ọmọ Elihu, ọmọ Tohu, ọmọ Sufu, ará Efrata.
2 Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.
Ó sì ní ìyàwó méjì, orúkọ wọn ni Hana àti Penina: Penina ní ọmọ, ṣùgbọ́n Hana kò ní.
3 Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.
Ní ọdọọdún, ọkùnrin yìí máa ń gòkè láti ìlú rẹ̀ láti lọ sìn àti láti ṣe ìrúbọ sí Olúwa àwọn ọmọ-ogun jùlọ ní Ṣilo, níbi tí àwọn ọmọkùnrin Eli méjèèjì, Hofini àti Finehasi ti jẹ́ àlùfáà Olúwa.
4 Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.
Nígbàkígbà tí ó bá kan Elkana láti ṣe ìrúbọ, òun yóò bù lára ẹran fún aya rẹ̀ Penina àti fún gbogbo àwọn ọmọ ọkùnrin àti obìnrin.
5 Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
Ṣùgbọ́n ó máa ń pín ìlọ́po fun Hana nítorí pé ó fẹ́ràn rẹ̀ àti pé Olúwa ti sé e nínú.
6 Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
Nítorí pé Olúwa ti sé e nínú, orogún rẹ̀ bẹ̀rẹ̀ sí ní fín níràn láti lè mú kí ó bínú.
7 Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.
Eléyìí sì máa ń ṣẹlẹ̀ ní ọdọọdún. Nígbàkígbà tí Hana bá gòkè lọ sí ilé Olúwa, orogún rẹ̀ a máa fín níràn títí tí yóò fi máa sọkún tí kò sì ní lè jẹun.
8 Mgbe Hana bidoro ịkwa akwa otu a, Elkena na-ajụ ya sị, “Hana, ọ bụ gịnị mere i ji na-akwa akwa? Gịnị mere ị naghị eri nri? Gịnị mere obi ji ajọ gị njọ? Ọ bụ na mụ adịghị gị mma karịa ụmụ ndị ikom iri nye gị?”
Elkana ọkọ rẹ̀ yóò sọ fún un pé, “Hana èéṣe tí ìwọ fi ń sọkún? Èéṣe tí ìwọ kò fi jẹun? Èéṣe tí ìwọ fi ń ba ọkàn jẹ́? Èmi kò ha ju ọmọ mẹ́wàá lọ fún ọ bí?”
9 Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị.
Lẹ́yìn ìgbà tí wọ́n ti jẹ, tí wọ́n tún mu tán ní Ṣilo, Hana dìde wá síwájú Olúwa. Nígbà náà, Eli àlùfáà wà lórí àga ní ẹ̀gbẹ́ ẹnu-ọ̀nà ilé Olúwa ní ibi tí ó máa ń jókòó.
10 Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.
Pẹ̀lú ẹ̀dùn ọkàn Hana sọkún gidigidi, ó sì gbàdúrà sí Olúwa.
11 O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”
Ó sì jẹ́ ẹ̀jẹ́ wí pé, “Olúwa àwọn ọmọ-ogun, jùlọ tí ìwọ bá le bojú wo ìránṣẹ́bìnrin rẹ kí ìwọ sì rántí rẹ̀, tí ìwọ kò sì gbàgbé ìránṣẹ́ rẹ ṣùgbọ́n tí ìwọ yóò fún un ní ọmọkùnrin, nígbà náà èmi yóò sì fi fún Olúwa ní gbogbo ọjọ́ ayé rẹ̀ a kì yóò sì fi abẹ kàn án ní orí.”
12 Mgbe ọ nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ.
Bí ó sì ṣe ń gbàdúrà sí Olúwa, Eli sì kíyèsi ẹnu rẹ̀.
13 Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu.
Hana ń gbàdúrà láti inú ọkàn rẹ̀, ṣùgbọ́n ètè rẹ̀ ni ó ń mì, a kò gbọ́ ohùn rẹ̀. Eli rò wí pé ó ti mu ọtí yó.
14 Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!”
Eli sì wí fún un pé, “Yóò ti pẹ́ fún ọ tó tí ìwọ yóò máa yó? Mú ọtí wáìnì rẹ̀ kúrò.”
15 Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.
Hana dá a lóhùn pé, “Bẹ́ẹ̀ kọ́, Olúwa mi, èmi ni obìnrin oníròbìnújẹ́. Èmi kò mu ọtí wáìnì tàbí ọtí líle; èmi ń tú ọkàn mi jáde sí Olúwa ni.
16 Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.”
Má ṣe mú ìránṣẹ́ rẹ gẹ́gẹ́ bí obìnrin búburú. Èmi ti ń gbàdúrà níhìn-ín nínú ìrora ọkàn àti ìbànújẹ́ mi.”
17 Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”
Eli dáhùn pé, “Máa lọ ní àlàáfíà, kí Ọlọ́run Israẹli fi ohun tí ìwọ ti béèrè ní ọwọ́ rẹ̀ fún ọ.”
18 Hana zara sị, “Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma.” O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.
Ó wí pé, “Kí ìránṣẹ́bìnrin rẹ rí oore-ọ̀fẹ́ lójú rẹ.” Bẹ́ẹ̀ ni obìnrin náà bá tirẹ̀ lọ, ó sì jẹun, kò sì fa ojú ro mọ́.
19 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya.
Wọ́n sì dìde ni kùtùkùtù òwúrọ̀, wọn wólẹ̀ sìn níwájú Olúwa, wọn padà wa sí ilé wọn ni Rama: Elkana si mọ Hana aya rẹ̀: Olúwa sì rántí rẹ̀.
20 Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”
Ó sì ṣe, nígbà tí ọjọ́ rẹ̀ pé, lẹ́yìn ìgbà tí Hana lóyún, ó sì bí ọmọkùnrin kan, ó sì pe orúkọ rẹ̀ ní Samuẹli, pé, “Nítorí tí mo béèrè rẹ̀ lọ́wọ́ Olúwa.”
21 Mgbe di ya, bụ Elkena na ndị ezinaụlọ ya gara Shaịlo ịchụrụ Onyenwe anyị aja nke afọ ahụ, na ịchụkwa aja metụtara nkwa dị iche nke o kwere Onyenwe anyị,
Ọkùnrin náà Elkana, àti gbogbo àwọn ará ilé rẹ̀, gòkè lọ láti rú ẹbọ ọdún sí Olúwa, àti láti sán ẹ̀jẹ́ rẹ̀.
22 Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara, ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Ṣùgbọ́n Hana kò gòkè lọ; nítorí tí ó sọ fún ọkọ rẹ̀ pé, “Ó di ìgbà tí mo bá gba ọmú lẹ́nu ọmọ náà, nígbà náà ni èmi yóò mú un lọ, kí òun lè fi ara hàn níwájú Olúwa, kí ó sí máa gbé ibẹ̀ títí láé.”
23 Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.
Elkana ọkọ rẹ̀ sì wí fún un pé, “Ṣe èyí tí ó tọ́ lójú rẹ. Dúró títí ìwọ yóò fi gba ọmú lẹ́nu rẹ̀; ṣùgbọ́n kí Olúwa sá à mú ọ̀rọ̀ rẹ̀ ṣẹ.” Bẹ́ẹ̀ ni obìnrin náà sì jókòó, ó sì fi ọmú fún ọmọ rẹ̀ títí ó fi gbà á lẹ́nu rẹ̀.
24 Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.
Nígbà tí ó sì gba ọmú lẹ́nu rẹ̀, ó sì mú un gòkè lọ pẹ̀lú ara rẹ̀. Pẹ̀lú ẹgbọrọ màlúù mẹ́ta, àti ìyẹ̀fun efa kan, àti ìgò ọtí wáìnì kan, ó sì mú un wá sí ilé Olúwa ní Ṣilo: ọmọ náà sì wà ní ọmọdé.
25 Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ.
Wọ́n pa ẹgbọrọ màlúù, wọ́n sì mú ọmọ náà tọ Eli wá.
26 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.
Hana sì wí pé, “Olúwa mi, bí ọkàn rẹ ti wà láààyè, Olúwa mi, èmi ni obìnrin náà tí ó dúró lẹ́bàá ọ̀dọ̀ rẹ níhìn-ín tí ń tọrọ lọ́dọ̀ Olúwa.
27 Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.
Ọmọ yìí ni mo ń tọrọ; Olúwa sì fi ìdáhùn ìbéèrè tí mo béèrè lọ́dọ̀ rẹ̀ fún mi.
28 Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.
Nítorí náà pẹ̀lú, èmi fi í fún Olúwa; ní gbogbo ọjọ́ ayé rẹ̀: nítorí tí mo ti béèrè rẹ̀ fún Olúwa.” Wọn si wólẹ̀ sin Olúwa níbẹ̀.

< 1 Samuel 1 >