< 1 Samuel 8 >
1 Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel.
Now when Samuel was old, he made his sons judges over Israel.
2 Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe.
The name of his first son was Joel and the name of his second Abijah: they were judges in Beer-sheba.
3 Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
And his sons did not go in his ways, but moved by the love of money took rewards, and were not upright in judging.
4 Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya,
Then all the responsible men of Israel got together and went to Samuel at Ramah,
5 “I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”
And said to him, See now, you are old, and your sons do not go in your ways: give us a king now to be our judge, so that we may be like the other nations.
6 Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere.
But Samuel was not pleased when they said to him, Give us a king to be our judge. And Samuel made prayer to the Lord.
7 Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.
And the Lord said to Samuel, Give ear to the voice of the people and what they say to you: they have not been turned away from you, but they have been turned away from me, not desiring me to be king over them.
8 Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a.
As they have done from the first, from the day when I took them out of Egypt till this day, turning away from me and worshipping other gods, so now they are acting in the same way to you.
9 Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.”
Give ear now to their voice: but make a serious protest to them, and give them a picture of the sort of king who will be their ruler.
10 Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe Onyenwe anyị kwuru.
And Samuel said all these words of the Lord to the people who were desiring a king.
11 Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya.
And he said, This is the sort of king who will be your ruler: he will take your sons and make them his servants, his horsemen, and drivers of his war-carriages, and they will go running before his war-carriages;
12 Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya.
And he will make them captains of thousands and of fifties; some he will put to work ploughing and cutting his grain and making his instruments of war and building his war-carriages.
13 Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.
Your daughters he will take to be makers of perfumes and cooks and bread-makers.
14 Ọ ga-anarakwa unu ubi unu, na ubi vaịnị unu, na ubi oliv unu ndị kachasị mma, were ha nye ndị na-ejere ya ozi.
He will take your fields and your vine-gardens and your olive-gardens, all the best of them, and give them to his servants.
15 Ọ ga-ewere otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke mkpụrụ ubi unu na ubi vaịnị unu nye ndịisi ọrụ ya na ndị na-ejere ya ozi.
He will take a tenth of your seed and of the fruit of your vines and give it to his servants.
16 Ọ ga-akwagidekwa unu ka unu nye ya ndị ohu unu, ndị ikom nʼime ha, na ndị inyom nʼime ha, ya na anụ ụlọ unu ahụ dị ezi mma, na ịnyịnya ibu unu.
He will take your men-servants and your servant-girls, and the best of your oxen and your asses and put them to his work.
17 Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe anụ ụlọ unu, meekwa ka unu onwe unu bụrụkwa ndị ohu ya.
He will take a tenth of your sheep: and you will be his servants.
18 Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma Onyenwe anyị agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.”
Then you will be crying out because of your king whom you have taken for yourselves; but the Lord will not give you an answer in that day.
19 Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị.
But the people gave no attention to the voice of Samuel; and they said, No, but we will have a king over us,
20 Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.”
So that we may be like the other nations, and so that our king may be our judge and go out before us to war.
21 Samuel gwara Onyenwe anyị ihe niile ha kwuru.
Then Samuel, after hearing all the people had to say, went and gave an account of it to the Lord.
22 Ma Onyenwe anyị zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.” Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”
And the Lord said to Samuel, Give ear to their voice and make a king for them. Then Samuel said to the men of Israel, Let every man go back to his town.