< 1 Samuel 6 >
1 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa.
上主的約櫃在培肋舍特地方七個月之久。
2 Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.”
培肋舍特人召集司祭和占卜者說:「我們對上主的約櫃該作什麼﹖請告訴我們,用什麼方法可將它送回原處﹖」
3 Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”
他們回答說:「你們若將以色列天主的約櫃送回,不可空空的將它送回,必須奉上贖罪的禮品:這樣你們纔能痊癒,也會明瞭他的手為什麼沒有離開你們。」
4 Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.” A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile.
他們問說:「我們應奉上什麼贖罪的禮品﹖」他們回答說:「按照培肋舍特酋長的數目,奉上五個金毒瘡像和五個金鼠像,因為你們所有的人和你們的酋長,都遭遇同樣的災禍。
5 Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ.
所以你們應製造你們患的毒瘡像,和損壞你們地方的老鼠的像,應歸光榮於以色列的天主:這樣或許他會對你們,對你們的神和你們的地方放鬆他的手。
6 Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa?
你們為什麼像埃及人和法郎一樣心硬呢﹖不是上主玩弄了他們以後,埃及人纔放走了他們嗎﹖
7 “Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi.
現今,趕快製造一輛新車,牽出兩頭正在哺乳,還沒有負過軛的母牛來,套上這輛新車,把小牛牽回棚裏去;
8 Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso.
然後把上主的約櫃裝在車上,把那奉上作為贖罪禮品的金器,都盛在一匣子內,放在約櫃旁邊,然後讓它去。
9 Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”
但你們應留神:若是約櫃取道往自己的地方去,即往貝特舍默士去,那麼,這大災難,即是上主加給我們的;若不然,我們就知道,不是他的手打擊了我們,而我們所遭遇的是出於偶然。」
10 Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ.
人們就這樣作了;牽出兩頭正在哺乳的母牛來,套上那輛新車,將牛犢關在棚裏,
11 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ.
把上主的約櫃,以及裝有金老鼠和毒瘡像的匣子,都放在車上。
12 Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.
那對母牛直直奔向貝特舍默士的路上走去,一邊走,一邊叫,不偏左也不偏右;培肋舍特的酋長跟在後面,一直到了貝特舍默士的邊境。
13 Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi.
那時,貝特舍默士人正在谷中收割麥子,舉目一看,見是上主的約櫃,就前去歡迎。
14 Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
車來到貝特舍默士人約叔亞的莊田,就在那裏停住了。那裏有一塊大石頭,人就將車輛的木頭劈開,把母牛祭獻給上主作全燔祭。
15 Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.
肋未人先把上主的約櫃和旁邊盛有金器的匣子搬下來,放在那塊大石上。貝特舍默士人當天給上主獻了全燔祭,宰殺了許多犧牲。
16 Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ.
培肋舍特的五位酋長見事已成,當天就回了厄刻龍。
17 Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn.
以下是培肋舍特人奉獻給上主作為贖罪禮品的金毒瘡像:阿市多得一個,迦薩一個,阿市刻隆一個,加特一個,厄刻龍一個。
18 Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.
金老鼠也是依照培肋舍特五酋長的城市數目,包括有垣墻的城市和所有的村落。那曾安放過上主約櫃的大石,直到今日還在貝特舍默士人約叔亞的田內,作為見證。
19 Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu.
當貝特舍默士人看見上主的約櫃時,耶苛尼雅的子孫沒有與他們一起表示歡樂,所以上主擊殺了他們中七十人。百姓就難受,因為上主這樣嚴厲打擊了百姓。
20 Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”
於是貝特舍默士人說:「在這神聖的天主上主面前,誰還能站得住﹖從我們這裏把它送到誰那裏去呢﹖」
21 Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”
他們遂派使者到克黎雅特耶阿陵的居民那裏,對他們說:「培肋舍特人送回了上主的約櫃,你們下來,將它抬上去,放在你們那裏。」