< 1 Samuel 4 >

1 Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị. Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek.
And Samuel's words came to all Israel. And Eli grew very old, and his sons kept advancing in their wicked behavior before the LORD. And it came to pass in those days that the Philistines gathered themselves together against Israel. And Israel went out to meet them in battle, and camped beside Ebenezer, and the Philistines camped in Aphek.
2 Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha.
The Philistines put themselves in array against Israel: and when they joined battle, Israel was struck before the Philistines; and they killed of the army in the field about four thousand men.
3 Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ka o soro anyị jee agha, ka ọ napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị.”
When the people had come into the camp, the elders of Israel said, "Why has the LORD struck us today before the Philistines? Let us get the ark of the LORD out of Shiloh to us, that it may come among us, and save us out of the hand of our enemies."
4 Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ.
So the people sent to Shiloh; and they brought from there the ark of the LORD, who sits above the cherubim: and the two sons of Eli, Hophni and Phinehas, were there with the ark of God.
5 Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji.
When the ark of the LORD came into the camp, all Israel shouted with a great shout, so that the earth rang again.
6 Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?” Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela,
When the Philistines heard the noise of the shout, they said, "What does the noise of this great shout in the camp of the Hebrews mean?" They understood that the ark of the LORD had come into the camp.
7 ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga.
The Philistines were afraid, for they said, "Gods have come into the camp." They said, "Woe to us. For there has not been such a thing before.
8 Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara.
Woe to us. Who shall deliver us out of the hand of these mighty gods? These are the gods that struck the Egyptians with all kinds of plagues in the wilderness.
9 Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!”
Be strong, and behave like men, O you Philistines, that you not be servants to the Hebrews, as they have been to you. Strengthen yourselves like men, and fight."
10 Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.
So they fought, and Israel was defeated, and they fled every man to his tent. And there was a very great slaughter, for there fell of Israel thirty thousand footmen.
11 Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị.
The ark of God was taken; and the two sons of Eli, Hophni and Phinehas, were slain.
12 Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.
There ran a man of Benjamin out of the army, and came to Shiloh the same day, with his clothes torn, and with earth on his head.
13 Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.
When he came, look, Eli was sitting on his seat by the side of the gate watching the road, for his heart trembled for the ark of God. When the man came into the city, and told it, all the city cried out.
14 Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.
When Eli heard the noise of the crying, he said, "What does the noise of this tumult mean?" The man hurried, and came and told Eli.
15 Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.
Now Eli was ninety-eight years old; and his eyes were set, so that he could not see.
16 Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.” Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”
The man said to Eli, "I am he who came out of the army, and I fled today out of the army." He said, "How did the matter go, my son?"
17 Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”
He who brought the news answered, "Israel has fled before the Philistines, and there has been also a great slaughter among the people. Your two sons also, Hophni and Phinehas, are dead, and the ark of God has been captured."
18 Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ.
It happened, when he made mention of the ark of God, that Eli fell from off his seat backward by the side of the gate; and his neck broke, and he died; for he was an old man, and heavy. He had judged Israel forty years.
19 Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime.
His daughter-in-law, Phinehas' wife, was with child, near to be delivered. When she heard the news that the ark of God was taken, and that her father-in-law and her husband were dead, she bowed herself and gave birth; for her pains came on her.
20 Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.
When her time came, she was abount to die, and the women who stood by her said to her, "Do not be afraid; for you have given birth to a son." But she did not answer, neither did she regard it.
21 Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya.
And she named the boy Ichabod, because of the ark of God, and because of her father-in-law and her husband.
22 O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.”
She said, "The glory has departed from Israel, for the ark of God has been captured."

< 1 Samuel 4 >