< 1 Samuel 31 >

1 Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
Now, as, the Philistines, were fighting against Israel, the men of Israel fled from before the Philistines, and fell slain, in Mount Gilboa.
2 Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
And the Philistines followed hard after Saul, and after his sons, —and the Philistines smote Jonathan and Abinadab and Malchishua, sons of Saul.
3 Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.
And the battle went sore against Saul, and the archers discovered him, —and he was terrified at the archers.
4 Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
Then said Saul to his armour-bearer—Draw thy sword and pierce me through therewith, lest these uncircumcised come, and pierce me through, and abuse me. But his armour-bearer was not willing, for he was sore afraid. So Saul took his sword and fell thereon.
5 Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
And, when his armour-bearer saw that Saul was dead, he also, fell upon his sword, and died with him.
6 Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.
Thus died Saul, and his three sons, and his armour-bearer, yea all his men, on that day, together.
7 Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
And, when the men of Israel who were across the vale, and who were across the Jordan, saw that the men of Israel had fled, and that Saul and his sons were dead, they forsook the cities, and fled, and the Philistines entered, and took up their abode therein.
8 Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
And it came to pass on the morrow, when the Philistines came to strip the slain, that they found Saul, and his three sons, lying prostrate in Mount Gilboa.
9 Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.
So they cut off his head, and stripped off his armour, —and sent throughout the land of the Philistines round about, to publish it in the house of their idols, and unto the people.
10 Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan.
And they put his armour in a house of Ashtoreths, —and, his dead body, fastened they on the wall of Beth-shan.
11 Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
And, when the inhabitants of Jabesh-gilead heard concerning him, what the Philistines had done unto Saul,
12 ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.
then arose all the men of valour, and journeyed all the night, and took the body of Saul, and the bodies of his sons, from the wall of Beth-shan, —and came to Jabesh, and burned them there;
13 Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
and took their bones, and buried them under the tamarisk-tree in Jabesh, —and fasted seven days.

< 1 Samuel 31 >