< 1 Samuel 29 >
1 Ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha bịaruo Afek, ma ndị agha Izrel zukọtara nʼakụkụ isi iyi Jezril.
Basi Wafilisti walikusanya pamoja majeshi yao yote huko Afeki; Waisraeli wakapiga kambi karibu na chemchemi iliyoko Yezreeli.
2 Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia.
Nao wakuu wa Wafilisti wakapitwa na mamia kwa maelfu; Daudi na watu wake wakapita wakiwa wa mwisho pamoja na Akishi.
3 Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.”
Kisha wakuu wa Wafilisti wakasema, “Hawa Waebrania wanafanya nini hapa?” Akishi akawaambia wakuu wengine wa Wafilisti, “Huyu si Daudi, mtumishi wa Sauli, mfalme wa Israeli, ambaye amekaa nami kwa siku hizi, au kwa miaka hii, nami nimeona hana kosa tangu aje kwangu hadi leo?”
4 Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?”
Lakini wale wakuu wa Wafilisti walimkasirikia Akishi; wakamwabia, Mfukuze mtu huyo, aende kwake kule ulikompatia; usimruhusu aende nasi vitani, ili asiwe adui yetu katika vita. Kwa jinsi gani mtu huyu angeweza kufanya amani na bwana wake? Siyo kwa gharama ya vichwa vya watu wetu?
5 Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?”
Je, huyu siye Daudi ambaye walimuimba kwa kupokezana na kucheza, wakisema: 'Sauli ameua maelfu yake, Na Daudi makumi elfu yake?”'
6 Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị.
Ndipo Akishi alimwita Daudi na kumwambia, “Kama BWANA aishivyo, umekuwa mwema, na kutoka kwako na kuingia kwako pamoja nami katika jeshi ni kwema kama nionavyo mimi; maana sijaona kosa kwako tangu siku unakuja kwangu hadi siku hii ya leo. Hata hivyo, wakuu hawakupendi.
7 Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.”
Basi sasa rudi na uende kwa amani, ili usiwakwaze wakuu wa Wafilisti.”
8 Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?”
Daudi akamwambia Akishi, “Lakini nimefanya nini? Kitu gani umekiona kwa mtumishi wako kwa muda ambao nimekuwa mbele yako hadi leo, kiasi kwamba nisiende kupigana na adui za bwana wangu mfalme?”
9 Akish zaghachiri, “Ama m nʼonye dị mma ka ị bụ nʼanya m, dịka mmụọ ozi nke Chineke. Nʼagbanyeghị nke a, ọchịagha ndị Filistia asịla, ‘Ọ gaghị eso anyị jee nʼagha.’
Akishi akajibu na kumwambia Daudi, “Najua kwamba hauna lawama mbele zangu kama alivyo malaika wa Mungu; hata hivyo, wale wakuu wa Wafilisti wamesema, Kamwe hatapanda pamoja nasi hadi vitani.'
10 Ya mere, bilie nʼisi ụtụtụ, gị na ndị ọrụ onyenwe gị ndị soro gị bịa, bilienụ nʼisi ụtụtụ laghachi mgbe ìhè dịrị unu.”
Basi sasa amka asubuhi na mapema na watumishi wa bwana wako waliokuja pamoja nawe; mara tu muamkapo asubuhi na mapema na kupata mwanga, ondokeni.”
11 Devid na ndị ikom na-eso ya biliri nʼisi ụtụtụ ịlaghachi nʼala ndị Filistia. Ma ndị agha ndị Filistia gara nʼihu jeruo Jezril.
Hivyo Daudi aliamka mapema, yeye pamoja na watu wake, waondoke asubuhi, warudi kule katika nchi ya Wafilisti. Lakini Wafilisti walipanda kwenda Yezreeli.