< 1 Samuel 28 >

1 Nʼoge ahụ, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha jikere ịlụso ndị Izrel agha. Akish eze Gat gwara Devid okwu, “Ghọtakwa na gị na ndị agha gị ga-eso mụ na ndị agha m gaa ibu agha.”
And it came to pass in those days that the Philistines gathered together their armies for warfare to fight against Israel. And Achish said to David, Know thou assuredly that thou shalt go out with me to the camp, thou and thy men.
2 Devid zara ya sị, “Ị ga-eji anya gị hụrụ ihe ohu gị ga-eme.” Akish zara sị, “Ọ dị mma aga m eme gị onye nche m ụbọchị ndụ gị niile.”
And David said to Achish, Thereby thou shalt know what thy servant can do. And Achish said to David, Therefore will I make thee keeper of my person for ever.
3 Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
(Now Samuel was dead, and all Israel had lamented him, and they had buried him in Ramah, even in his own city. And Saul had put away the necromancers and the soothsayers out of the land.)
4 Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa.
And the Philistines gathered themselves together, and came and encamped in Shunem; and Saul gathered all Israel together, and they encamped in Gilboa.
5 Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya.
And when Saul saw the camp of the Philistines, he was afraid, and his heart greatly trembled.
6 Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma.
And Saul inquired of Jehovah; but Jehovah did not answer him, either by dreams, or by Urim, or by prophets.
7 Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”
Then said Saul to his servants, Seek me a woman that has a spirit of Python, that I may go to her and inquire of her. And his servants said to him, Behold, there is a woman who has a spirit of Python at En-dor.
8 Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase, kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.”
And Saul disguised himself, and put on other garments, and he went, and two men with him, and they came to the woman by night; and he said, I pray thee, divine to me by the spirit of Python, and bring me [him] up whom I shall name to thee.
9 Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?”
And the woman said to him, Behold, thou knowest what Saul has done, how he has cut off the necromancers and the soothsayers out of the land; and why layest thou a snare for my life, to cause me to die?
10 Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.”
And Saul swore unto her by Jehovah, saying, [As] Jehovah liveth, there shall no punishment happen to thee for this thing.
11 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”
Then said the woman, Whom shall I bring up to thee? And he said, Bring me up Samuel.
12 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”
And when the woman saw Samuel, she cried out with a loud voice; and the woman spoke to Saul, saying, Why hast thou deceived me? Even thou art Saul.
13 Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”
And the king said to her, Be not afraid; but what didst thou see? And the woman said to Saul, I saw a god ascending out of the earth.
14 Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.
And he said to her, What is his form? And she said, An old man comes up; and he is covered with a mantle. And Saul knew that it was Samuel, and he stooped with his face to the ground, and bowed himself.
15 Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?” Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”
And Samuel said to Saul, Why hast thou disquieted me, to bring me up? And Saul said, I am sore distressed; for the Philistines make war against me, and God is departed from me, and answers me no more, neither by prophets nor by dreams; therefore I have called thee, that thou mayest make known to me what I shall do.
16 Samuel sịrị, “Nʼihi gịnị ka i ji na-ajụ m, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị ewezugala onwe ya site nʼebe ị nọ, ghọọkwara gị onye iro?
And Samuel said, Why then dost thou inquire of me, seeing Jehovah is departed from thee, and is become thine enemy?
17 Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.
And Jehovah has done for himself as he spoke by me; and Jehovah has rent the kingdom out of thy hand, and given it to thy neighbour, to David.
18 Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.
Because thou didst not hearken to the voice of Jehovah, and didst not execute his fierce anger upon Amalek, therefore has Jehovah done this thing to thee this day.
19 Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”
And Jehovah will also give Israel with thee into the hand of the Philistines; and to-morrow shalt thou and thy sons be with me; the army of Israel also will Jehovah give into the hand of the Philistines.
20 Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.
And Saul fell straightway his full length on the earth, and was sore afraid because of the words of Samuel; and there was no strength in him, for he had eaten no bread all the day nor all the night.
21 Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.
And the woman came to Saul, and saw that he was sore troubled, and said to him, Behold, thy bondmaid has hearkened to thy voice, and I have put my life in my hand, and have hearkened to thy words which thou spokest to me.
22 Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.”
And now, I pray thee, hearken thou also to the voice of thy bondmaid, and let me set a morsel of bread before thee; and eat, that thou mayest have strength when thou goest on thy way.
23 Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla. Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina.
But he refused and said, I will not eat. Then his servants, and the woman also, compelled him, and he hearkened to their voice; and he arose from the earth and sat on the bed.
24 Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,
And the woman had a fat calf in the house; and she hasted and killed it, and took flour, and kneaded it, and baked unleavened bread thereof;
25 O doziri nri nʼihu Sọl na ndị ikom ya. Ha rikwara ya. Ha biliri laa nʼabalị ahụ.
and she brought it near before Saul, and before his servants, and they ate. And they rose up and went away that night.

< 1 Samuel 28 >