< 1 Samuel 28 >

1 Nʼoge ahụ, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha jikere ịlụso ndị Izrel agha. Akish eze Gat gwara Devid okwu, “Ghọtakwa na gị na ndị agha gị ga-eso mụ na ndị agha m gaa ibu agha.”
Mʼmasiku amenewo Afilisti anasonkhanitsa ankhondo awo kuti akamenyane ndi Aisraeli. Akisi anawuza Davide kuti, “Udziwe kuti iwe pamodzi ndi anthu ako mudzapita nane ku nkhondo.”
2 Devid zara ya sị, “Ị ga-eji anya gị hụrụ ihe ohu gị ga-eme.” Akish zara sị, “Ọ dị mma aga m eme gị onye nche m ụbọchị ndụ gị niile.”
Davide anayankha kuti, “Tsono inu mudzaona zimene mtumiki wanune ndingachite.” Akisi anayankha kuti, “Chabwino ine ndidzakuyika iwe kukhala mlonda wanga moyo wako wonse.”
3 Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
Nthawi imeneyi nʼkuti Samueli atamwalira, ndipo Aisraeli onse anamulira namuyika mʼmanda ku mzinda wake wa Rama. Sauli anali atachotsa mʼdzikomo anthu owombeza mawula ndi woyankhula ndi mizimu ya anthu akufa.
4 Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa.
Tsono Afilisti anasonkhana nabwera kudzamanga misasa yawo ku Sunemu. Nayenso Sauli anasonkhanitsa Aisraeli onse ndi kumanga misasa yawo ku Gilibowa.
5 Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya.
Sauli ataona gulu lankhondo la Afilisti anaopa ndipo ananjenjemera kwambiri.
6 Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma.
Choncho Sauli anafunsa nzeru kwa Yehova koma Yehova sanamuyankhe ngakhale kudzera mʼmaloto, kapena mwa Urimu ngakhalenso kudzera mwa aneneri.
7 Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”
Kenaka Sauli anawuza nduna zake kuti, “Mundipezere mkazi amene amawombeza mawula kuti ndipite ndikafunse kwa iye.” Nduna zakezo zinamuyankha kuti, “Alipo mkazi woyankhula ndi mizimu ya anthu akufa ku Endori.”
8 Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase, kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.”
Kotero Sauli anadzizimbayitsa navala zovala zachilendo. Tsono iye pamodzi ndi anthu awiri anapita nakafika kwa mkazi uja usiku, ndipo anamupempha kuti, “Chonde ndifunsireni nzeru kwa mizimu ya anthu akufa. Koma makamaka munditulutsire mzimu wa amene ndimutchule.”
9 Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?”
Koma mkaziyo anayankha kuti, “Ndithu inu mukudziwa chimene Sauli anachita. Paja iye anachotsa mʼdziko muno anthu onse owombeza ndi woyankhula ndi mizimu ya anthu akufa. Chifukwa chiyani mukutchera moyo wanga msampha kuti ndiphedwe?”
10 Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.”
Koma Sauli analonjeza mkaziyo molumbira nati, “Pali Yehova wamoyo, iweyo sudzalangidwa chifukwa cha zimenezi.”
11 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”
Kenaka mkaziyo anafunsa, “Ndikuyitanireni yani?” Iye anati, “Undiyitanire Samueli.”
12 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”
Pamene mkaziyo anaona Samueli anakuwa kwambiri, nawuza Sauli kuti, “Nʼchifukwa chiyani inu mwandipusitsa? Inu ndinu Sauli!”
13 Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”
Mfumuyo inamuwuza kuti, “Usaope. Kodi ukuona chiyani?” Mkaziyo anayankha kuti, “Ndikuona mzimu ukutuluka pansi.”
14 Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.
Sauli anafunsa, “Kodi mzimuwo ukuoneka motani?” Mkaziyo anayankha kuti, “Amene akutuluka ndi munthu wokalamba ndipo wavala mkanjo.” Apo Sauli anadziwa kuti anali Samueli ndipo anawerama nagunditsa nkhope yake pansi.
15 Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?” Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”
Samueli anafunsa Sauli kuti, “Nʼchifukwa chiyani wandivutitsa pondiyitana kuti ndibwere kuno?” Sauli anayankha kuti, “Ine ndavutika kwambiri mʼmaloto. Afilisti akumenyana nane, ndipo Mulungu wandifulatira. Iye sakundiyankhulanso, ngakhale kudzera mwa aneneri kapena maloto. Choncho ndakuyitanani kuti mundiwuze zoti ndichite.”
16 Samuel sịrị, “Nʼihi gịnị ka i ji na-ajụ m, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị ewezugala onwe ya site nʼebe ị nọ, ghọọkwara gị onye iro?
Samueli anati, “Nʼchifukwa chiyani ukundifunsa ine, pakuti tsopano Yehova wakufulatira ndipo wasanduka mdani wako?
17 Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.
Yehova wakuchita zimene ananeneratu kudzera mwa ine. Yehova wachotsa ufumu mʼmanja mwako ndipo waupereka kwa mnansi wako, kwa Davide.
18 Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.
Yehova wachita zimenezi lero chifukwa sunamvere mawu ake ndipo sunawawonongeretu Aamaleki.
19 Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”
Yehova adzapereka ndithu iweyo pamodzi ndi Aisraeli kwa Afilisti. Ndipo mmawa iweyo ndi ana ako mudzakhala ndi ine kuno. Ndithu Yehova adzapereka gulu lankhondo la Aisraeli kwa Afilisti.”
20 Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.
Nthawi yomweyo Sauli anagwa pansi atadzazidwa ndi mantha chifukwa cha mawu a Samueli. Analibenso mphamvu, pakuti sanadye tsiku lonse.
21 Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.
Mkazi uja tsono anasendera kufupi ndi Sauli, ndipo ataona kuti Sauli akuchita mantha, anamuwuza kuti, “Taonani, mdzakazi wanune ndakumverani. Ndayika moyo wanga pa chiswe ndipo ndamvera zimene munandiwuza.
22 Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.”
Tsono inunso mumvere mawu a mdzakazi wanune. Mundilole kuti ndikupatseni ka buledi pangʼono kuti mukhale ndi mphamvu zoyendera pa ulendo wanu.”
23 Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla. Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina.
Iye anakana ndipo anati, “Ayi, ine sindidya.” Koma nduna zake pamodzi ndi mkaziyo anamuwumiriza, ndipo anawamvera. Choncho anadzuka pansi nakhala pa bedi.
24 Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,
Mkaziyo anali ndi mwana wangʼombe wonenepa ndipo anamupha mwachangu. Anatenga ufa nawukanyanga ndipo anaphika buledi wopanda yisiti.
25 O doziri nri nʼihu Sọl na ndị ikom ya. Ha rikwara ya. Ha biliri laa nʼabalị ahụ.
Tsono anapereka bulediyo kwa Sauli ndi nduna zake ndipo anadya. Pambuyo pake ananyamuka kupita kwawo usiku womwewo.

< 1 Samuel 28 >