< 1 Samuel 26 >
1 Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara.
And the Ziphites came to Saul to Gibeah, saying, Does not David hide himself in the hill of Hachilah, facing the waste?
2 Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid.
And Saul arose, and went down to the wilderness of Ziph, having three thousand chosen men of Israel with him, to seek David in the wilderness of Ziph.
3 Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,
And Saul encamped in the hill of Hachilah, which faces the waste, by the way side. And David abode in the wilderness; and when he saw that Saul had come after him into the wilderness,
4 Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie.
David sent out spies, and learned that Saul was certainly come.
5 Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.
And David arose and came to the place where Saul had encamped; and David beheld the place where Saul lay, and Abner the son of Ner, the captain of his host; and Saul lay within the wagon-defence, and the people were encamped round about him.
6 Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?” Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.”
And David spake and said to Ahimelech the Hittite, and to Abishai the son of Zeruiah, Joab's brother, saying, Who will go down with me to Saul to the camp? And Abishai said, I will go down with thee.
7 Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.
And David and Abishai came to the people by night, and behold, Saul lay sleeping within the wagon-defence, and his spear stuck in the ground at his head; and Abner and the people lay round about him.
8 Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.”
And Abishai said to David, God has delivered thine enemy into thy hand this day; and now let me smite him, I pray thee, with the spear, even to the ground once, and I will not do it the second time.
9 Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?”
And David said to Abishai, Destroy him not; for who can stretch forth his hand against Jehovah's anointed, and be guiltless?
10 Ọ sịrị, “Nʼezie dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo.
And David said, [As] Jehovah liveth, Jehovah will surely smite him; either his day shall come to die, or he shall descend into battle and perish.
11 Ma Onyenwe anyị ekwela ka m setịpụ aka megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ugbu a, weta ùbe na ihe ịṅụ mmiri nke dị nʼakụkụ isi ya, ka anyị si nʼebe a pụọ.”
Jehovah forbid that I should stretch forth my hand against Jehovah's anointed! But now take, I pray thee, the spear that is at his head, and the cruse of water, and let us go.
12 Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.
And David took the spear and the cruse of water from Saul's head; and they went away, and no man saw [it], and none knew [it], and none awaked, for they were all asleep; for a deep sleep from Jehovah had fallen upon them.
13 Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha.
And David went over to the other side, and stood on the top of a hill afar off; a great space [being] between them.
14 Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?”
And David cried to the people, and to Abner the son of Ner, saying, Answerest thou not, Abner? Then Abner answered and said, Who art thou that criest to the king?
15 Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze.
And David said to Abner, Art not thou a man? and who is like to thee in Israel? and why hast thou not guarded thy lord the king? for one of the people came in to destroy the king thy lord.
16 Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”
This thing is not good which thou hast done. As Jehovah liveth, ye are worthy to die, because ye have not guarded your master, Jehovah's anointed. And now see where the king's spear is, and the cruse of water that was at his head.
17 Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?” Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.”
And Saul knew David's voice, and said, Is this thy voice, my son David? And David said, It is my voice, my lord, O king.
18 Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m?
And he said, Why does my lord thus pursue after his servant? for what have I done? or what evil is in my hand?
19 Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na Onyenwe anyị kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka Onyenwe anyị nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa Onyenwe anyị chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’
And now, I pray thee, let my lord the king hear the words of his servant. If Jehovah have moved thee against me, let him accept an oblation; but if the sons of men, cursed be they before Jehovah; for they have driven me out this day from adhering to the inheritance of Jehovah, saying, Go, serve other gods.
20 Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.”
And now, let not my blood fall to the earth far from the face of Jehovah; for the king of Israel is come out to seek a single flea, as when they hunt a partridge on the mountains.
21 Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.”
And Saul said, I have sinned: return, my son David; for I will no more do thee harm, because my life was precious in thine eyes this day: behold, I have acted foolishly, and have erred exceedingly.
22 Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya.
And David answered and said, Behold the king's spear, and let one of the young men come over and fetch it.
23 Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ.
And Jehovah will render to every man his righteousness and his faithfulness; for Jehovah gave thee into [my] hand this day, and I would not stretch forth my hand against Jehovah's anointed.
24 Ugbu a, ka Onyenwe anyị zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.”
And behold, as thy life was highly esteemed this day in mine eyes, so let my life be highly esteemed in the eyes of Jehovah, that he may deliver me out of all distress.
25 Sọl sịrị Devid, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nwa m, Devid. Ị ga-eme oke ihe, bụrụkwa onye na-emeri nʼagha.” Devid sitere nʼebe ahụ pụọ. Sọl laghachikwara nʼụlọ ya.
And Saul said to David, Blessed be thou, my son David: thou shalt certainly do [great things], and shalt certainly prevail. And David went on his way, and Saul returned to his place.