< 1 Samuel 25 >

1 Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.
Samuel died; and all Israel gathered themselves together, and lamented him, and buried him in his house at Ramah. David arose, and went down to the wilderness of Maon.
2 Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.
There was a man in Maon, whose possessions were in Carmel; and the man was very great, and he had three thousand sheep, and a thousand goats: and he was shearing his sheep in Carmel.
3 Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.
Now the name of the man was Nabal; and the name of his wife Abigail. And the woman was intelligent and beautiful, but the man was harsh and evil in his dealings; and the man was a Calebite.
4 Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,
David heard in the wilderness that Nabal was shearing his sheep.
5 o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.
So David sent ten young men, and said to the young men, "Go up to Carmel, and go to Nabal, and greet him in my name.
6 Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.
Thus you are to say to my brother, 'Peace be to you, and peace be to your house, and peace be to all that you have.
7 “‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.
And now, look, I have heard that you have shearers. Now your shepherds have been with us in the wilderness, and we did not hurt them, neither was there anything missing from them, all the while they were in Carmel.
8 Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’”
Ask your young men, and they will tell you. Therefore let the young men find favor in your eyes; for we come in a good day. Please give whatever comes to your hand, to your servants, and to your son David.'"
9 Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.
So the young men came and spoke to Nabal according to all those words on David's behalf, but he behaved arrogantly.
10 Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.
Nabal answered David's servants, and said, "Who is David? Who is the son of Jesse? There are many servants who break away from their masters these days.
11 M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”
Shall I then take my bread, and my wine, and my meat that I have slaughtered for the shearers of my sheep, and give it to men who I do not know where they come from?"
12 Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.
So David's young men turned on their way, and went back, and came and told him according to all these words.
13 Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.
David said to his men, "Every man put on his sword." So every man put on his sword. David also put on his sword. About four hundred men followed David; and two hundred stayed by the baggage.
14 Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.
But one of the young men told Abigail, Nabal's wife, saying, "Look, David sent messengers out of the wilderness to greet our master; and he railed at them.
15 Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.
But the men were very good to us, and we were not hurt, nor did we miss anything as long as we went with them, when we were in the fields.
16 Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.
They were a wall to us both by night and by day, all the while we were with them keeping the sheep.
17 Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”
Now therefore know and consider what you will do; for evil is determined against our master, and against all his house; for he is such a worthless fellow that one can't speak to him."
18 Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
Then Abigail hurried and took two hundred loaves of bread, two bottles of wine, five sheep ready dressed, five measures of parched grain, one hundred clusters of raisins, and two hundred cakes of figs, and laid them on donkeys.
19 Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.
She said to her young men, "Go on before me. Look, I come after you." But she did not tell her husband.
20 Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha
It was so, as she rode on her donkey, and came down by the covert of the mountain, that look, David and his men came down toward her; and she met them.
21 ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
Now David had said, "Surely in vain have I kept all that this fellow has in the wilderness, so that nothing was missed of all that pertained to him. He has returned me evil for good.
22 Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”
God do so to David, and more also, if I leave of all that belongs to him by the morning light so much as one who urinates on a wall."
23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.
When Abigail saw David, she hurried, and got off from her donkey, and fell before David on her face, and bowed herself to the ground at his feet.
24 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
And she said, "On me, my lord, be the guilt; and please let your servant speak to you directly, and hear the words of your servant.
25 Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.
Please do not let my lord regard this worthless fellow, for as his name is, so is he. Nabal is his name, and folly is with him; but I, your servant, did not see the young men whom you sent.
26 Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.
Now therefore, my lord, as the LORD lives, and as your soul lives, since the LORD has withheld you from blood guiltiness, and from avenging yourself with your own hand, now therefore let your enemies, and those who seek evil to my lord, be as Nabal.
27 Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.
Now this present which your servant has brought to my lord, let it be given to the young men who follow my lord.
28 “Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
Please forgive the trespass of your servant. For the LORD will certainly make my lord a sure house, because my lord fights the battles of the LORD; and evil shall not be found in you all your days.
29 Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.
Though men may rise up to pursue you, and to seek your soul, yet the soul of my lord shall be bound in the bundle of life with the LORD your God. He will sling out the souls of your enemies, as from the hollow of a sling.
30 Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel,
It shall come to pass, when the LORD has done to my lord according to all the good that he has spoken concerning you, and shall have appointed you prince over Israel,
31 onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”
that this will have no cause of grief or a troubled conscience for my lord, that blood was shed without cause and that my lord has gained victory by his own hand. And when the LORD has done well with my lord, then remember your servant."
32 Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m.
David said to Abigail, "Blessed is the LORD, the God of Israel, who sent you this day to meet me.
33 Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.
Blessed is your discretion, and blessed are you, that have kept me this day from blood guiltiness, and from avenging myself with my own hand.
34 Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”
For indeed, as the LORD, the God of Israel, lives, who has withheld me from hurting you, unless you had hurried and come to meet me, surely there wouldn't have been left to Nabal by the morning light so much as one who urinates on a wall."
35 Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”
So David received of her hand that which she had brought him: and he said to her, "Go up in peace to your house. Look, I have listened to your voice, and have granted your request."
36 Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ.
Abigail came to Nabal; and look, he held a feast in his house, like the feast of a king. Nabal's heart was merry within him, for he was very drunk. Therefore she told him nothing, less or more, until the morning light.
37 Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.
It happened in the morning, when the wine was gone out of Nabal, that his wife told him these things, and his heart died within him, and he became as a stone.
38 Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.
It happened about ten days after, that the LORD struck Nabal, so that he died.
39 Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya.
And David heard, and he said, "Blessed is the LORD, who has taken my side in the matter of Nabal's insult, and has kept back his servant from evil. The LORD has returned the evildoing of Nabal on his own head." David sent and spoke concerning Abigail, to take her to him as wife.
40 Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”
When the servants of David had come to Abigail to Carmel, they spoke to her, saying, "David has sent us to you, to take you to be his wife."
41 Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
She got up and bowed herself with her face to the ground, and said, "Look, your servant is a lowly servant to wash the feet of your servants."
42 Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
Then Abigail got up quickly and rode on a donkey, and with five female servants following her; and she followed the messengers of David, and became his wife.
43 Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.
David also took Ahinoam of Jezreel; and they both became his wives.
44 Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.
Now Saul had given Mikal his daughter, David's wife, to Palti the son of Laish, who was of Gallim.

< 1 Samuel 25 >