< 1 Samuel 24 >

1 Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.”
After Saul had returned from pursuing the Philistines, he was told, “David is in the wilderness of En-gedi.”
2 Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.
So Saul took three thousand chosen men from all Israel and went to look for David and his men in the region of the Rocks of the Wild Goats.
3 Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.
Soon Saul came to the sheepfolds along the road, where there was a cave, and he went in to relieve himself. And David and his men were hiding in the recesses of the cave.
4 Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.
So David’s men said to him, “This is the day about which the LORD said to you, ‘Behold, I will deliver your enemy into your hand, that you may do with him as you wish.’” Then David crept up secretly and cut off a corner of Saul’s robe.
5 Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl.
Afterward, David’s conscience was stricken because he had cut off the corner of Saul’s robe.
6 Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.”
So he said to his men, “The LORD forbid that I should do such a thing to my master, the LORD’s anointed. May I never lift my hand against him, since he is the LORD’s anointed.”
7 Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.
With these words David restrained his men, and he did not let them rise up against Saul. Then Saul left the cave and went on his way.
8 Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.
After that, David got up, went out of the cave, and called out to Saul, “My lord the king!” When Saul looked behind him, David bowed facedown in reverence
9 Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ?
and said to Saul, “Why do you listen to the words of men who say, ‘Look, David intends to harm you’?
10 Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’
Behold, this day you have seen with your own eyes that the LORD delivered you into my hand in the cave. I was told to kill you, but I spared you and said, ‘I will not lift my hand against my lord, since he is the LORD’s anointed.’
11 Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.
See, my father, look at the corner of your robe in my hand. For I cut it off, but I did not kill you. See and know that there is no evil or rebellion in my hands. I have not sinned against you, even though you are hunting me down to take my life.
12 Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.
May the LORD judge between you and me, and may the LORD take vengeance on you, but my hand will never be against you.
13 Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.
As the old proverb says, ‘Wickedness proceeds from the wicked.’ But my hand will never be against you.
14 “Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị?
Against whom has the king of Israel come out? Whom are you pursuing? A dead dog? A flea?
15 Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
May the LORD be our judge and decide between you and me. May He take notice and plead my case and deliver me from your hand.”
16 Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa.
When David had finished saying these things, Saul called back, “Is that your voice, David my son?” Then Saul wept aloud
17 Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
and said to David, “You are more righteous than I, for you have rewarded me with good, though I have rewarded you with evil.
18 E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m.
And you have shown this day how well you have dealt with me; for when the LORD delivered me into your hand, you did not kill me.
19 Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa.
When a man finds his enemy, does he let him go away unharmed? May the LORD reward you with good for what you have done for me this day.
20 Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel.
Now I know for sure that you will be king, and that the kingdom of Israel will be established in your hands.
21 Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”
So now, swear to me by the LORD that you will not cut off my descendants or wipe out my name from my father’s house.”
22 Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.
So David gave his oath to Saul. Then Saul returned home, but David and his men went up to the stronghold.

< 1 Samuel 24 >