< 1 Samuel 23 >

1 Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile.
On dit à David: « Voici que les Philistins attaquent Keïla et pillent les aires de battage. »
2 Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.”
David consulta Yahvé, en disant: « Irai-je frapper ces Philistins? » Yahvé dit à David: « Va frapper les Philistins, et sauve Keïla. »
3 Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
Les hommes de David lui dirent: « Voici, nous avons peur ici en Juda. Combien plus encore si nous allons à Keïla contre les armées des Philistins? »
4 Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”
Et David consulta de nouveau Yahvé. Yahvé lui répondit: « Lève-toi, descends à Keïla, car je livrerai les Philistins entre tes mains. »
5 Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
David et ses hommes allèrent à Keïla, combattirent les Philistins, emmenèrent leur bétail et les tuèrent dans un grand carnage. David sauva ainsi les habitants de Keïla.
6 (Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).
Lorsque Abiathar, fils d'Ahimélec, s'enfuit vers David à Keïla, il descendit avec un éphod à la main.
7 Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.”
On annonça à Saül que David était arrivé à Keïla. Saül dit: « Dieu l'a livré entre mes mains, car il est enfermé en entrant dans une ville qui a des portes et des barres. »
8 Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.
Saül convoqua tout le peuple à la guerre, pour descendre à Keïla et assiéger David et ses hommes.
9 Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”
David savait que Saül préparait un mauvais coup contre lui. Il dit au prêtre Abiathar: « Apporte l'éphod ici. »
10 Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.
David dit alors: « Yahvé, Dieu d'Israël, ton serviteur a appris que Saül cherche à venir à Keïla pour détruire la ville à cause de moi.
11 Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.”
Les hommes de Keïla me livreront-ils entre ses mains? Saül descendra-t-il, comme ton serviteur l'a appris? Yahvé, le Dieu d'Israël, je t'en prie, dis-le à ton serviteur. » Yahvé a dit: « Il descendra. »
12 Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”
David dit alors: « Les hommes de Keila me livreront-ils, moi et mes hommes, entre les mains de Saül? » Yahvé a dit: « Ils te livreront. »
13 Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ.
Et David et ses hommes, qui étaient environ six cents, se levèrent et partirent de Keïla et allèrent où ils purent. Saül apprit que David s'était échappé de Keïla, et il renonça à s'y rendre.
14 Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
David resta dans le désert, dans les forteresses, et demeura dans la région des collines, dans le désert de Ziph. Saül le cherchait chaque jour, mais Dieu ne le livra pas entre ses mains.
15 Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya.
David vit que Saül était sorti pour chercher sa vie. David était dans le désert de Ziph, dans les bois.
16 Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke.
Jonathan, fils de Saül, se leva et alla vers David dans la forêt, et il affermit sa main en Dieu.
17 Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.”
Il lui dit: « Ne crains pas, car la main de Saül, mon père, ne te trouvera pas; tu seras roi d'Israël et je serai à côté de toi, et Saül, mon père, le sait aussi. »
18 Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya.
Ils firent tous deux une alliance devant Yahvé. Puis David resta dans la forêt et Jonathan alla dans sa maison.
19 Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn?
Alors les Ziphites montèrent vers Saül à Guibea, et dirent: David ne se cache-t-il pas avec nous dans les forteresses de la forêt, sur la colline de Hakila, qui est au sud du désert?
20 Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”
Maintenant donc, ô roi, descends. Selon tout le désir de ton âme, descends; et notre part sera de le livrer entre les mains du roi. »
21 Sọl zara ha sị, “Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi.
Saül dit: « Tu es béni de Yahvé, car tu as eu pitié de moi.
22 Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ.
Je t'en prie, va t'en assurer encore davantage, savoir et voir où est son repaire, et qui l'y a vu, car on m'a dit qu'il est très rusé.
23 Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.”
Vois donc, et prends connaissance de tous les repaires où il se cache; puis reviens me voir avec certitude, et je t'accompagnerai. S'il est dans le pays, je le chercherai parmi tous les milliers de Juda. »
24 Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn.
Ils se levèrent et allèrent à Ziph avant Saül; mais David et ses hommes étaient dans le désert de Maon, dans la plaine, au sud du désert.
25 Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ.
Saül et ses hommes allèrent à sa recherche. A cette nouvelle, David descendit au rocher et resta dans le désert de Maon. Lorsque Saül apprit cela, il poursuivit David dans le désert de Maon.
26 Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid.
Saül allait de ce côté de la montagne, et David et ses hommes de l'autre côté de la montagne. David se hâtait de s'enfuir par crainte de Saül, car Saül et ses hommes entouraient David et ses hommes pour les prendre.
27 Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.”
Mais un messager arriva à Saül en disant: « Dépêche-toi de venir, car les Philistins ont fait une incursion dans le pays! ».
28 Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa.
Saül s'en retourna donc de la poursuite de David et alla à l'encontre des Philistins. C'est pourquoi on appela ce lieu Sela Hammahlekoth.
29 Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.
David monta de là et habita dans les forteresses d'En Gedi.

< 1 Samuel 23 >