< 1 Samuel 22 >

1 Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ.
Dhavhidhi akabva kuGati akatizira kubako reAdhurami. Hama dzake uye neveimba yababa vake vakazvinzwa, vakaburuka vakaenda ikoko kwaakanga ari.
2 Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
Vose vaitambudzika kana kuti vaiva nezvikwereti, kana vainyunyuta vakaungana kwaari uye akava mutungamiri wavo. Varume vanenge mazana mana vakanga vanaye.
3 Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?”
Kubva ipapo Dhavhidhi akaenda kuMizipa muMoabhu akati kuna mambo weMoabhu, “Ungatendera here baba vangu namai vangu kuti vauye kuzogara newe kusvikira ndaziva zvandichaitirwa naMwari?”
4 Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.
Saka akavasiya kuna mambo weMoabhu, ivo vakagara naye nguva yose yakagara Dhavhidhi munhare.
5 Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.
Asi muprofita Gadhi akati kuna Dhavhidhi, “Usagara munhare. Enda kunyika yeJudha.” Saka Dhavhidhi akabva akaenda kusango reHereti.
6 Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya.
Zvino Sauro akanzwa kuti Dhavhidhi navanhu vake vakanga vawanikwa. Uye Sauro akanga akabata pfumo muruoko rwake, akagara pasi pomuti womutamarisiki pachikomo cheGibhea, uye vabati vake vose vakamira vakamupoteredza.
7 Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha?
Sauro akati kwavari, “Inzwai, imi varume veBhenjamini! Ko, mwanakomana waJese achakupai imi mose minda neminda yemizambiringa here? Ko, achakuitai imi mose vakuru vezviuru navakuru vamazana here?
8 Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.”
Ndizvo here zvaita kuti imi mose murangane kundimukira? Hakuna anondiudza nguva inoita mwanakomana wangu sungano nomwanakomana waJese. Hakuna kana mumwe wenyu ane hanya neni kana anondizivisa kuti mwanakomana wangu akarunzira muranda wangu kuti andivandire, sezvaanoita nhasi.”
9 Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob.
Asi Dhoegi muEdhomu, uyo akanga amire navaranda vaSauro, akati, “Ndakaona mwanakomana waJese achisvika kumba kwaAhimereki mwanakomana waAhitubhi paNobhi.
10 Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”
Ahimereki akamubvunzira kuna Jehovha; akamupazve mbuva uye nomunondo waGoriati muFiristia.”
11 Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze.
Ipapo mambo akatuma nhume kumuprista Ahimereki mwanakomana waAhitubhi uye nokumhuri yose yababa vake, avo vakanga vari vaprista paNobhi, vose vakauya kuna mambo.
12 Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.” Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.”
Sauro akati, “Zvino chinzwa, iwe mwanakomana waAhitubhi.” Akapindura akati, “Ndiri pano, ishe wangu.”
13 Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?”
Sauro akati kwaari, “Seiko mandirangana, iwe nomwanakomana waJese, uchimupa chingwa nomunondo uye nokumubvunzira kuna Mwari, zvokuti andimukira uye anondivandira, sezvaanoita nhasi?”
14 Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị?
Ahimereki akapindura mambo akati, “Ndianiko pakati pavaranda venyu vose akatendeka saDhavhidhi, mukuwasha wamambo, mukuru wavarindi venyu uye anokudzwa kwazvo mumba menyu?
15 Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”
Ko, ndiro rakanga riri zuva rokutanga here randakamubvunzira kuna Mwari? Zvirokwazvo kwete! Mambo ngaarege kupa mhosva muranda wenyu kana mumwe upi zvake wemhuri yababa vake, nokuti muranda wenyu haana kana chaanoziva pamusoro penyaya iyi yose.”
16 Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”
Asi mambo akati, “Zvirokwazvo uchafa, Ahimereki, iwe nemhuri yose yababa vako.”
17 O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!” Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị.
Ipapo mambo akarayira varindi vaiva padivi pake akati, “Tendeukai muuraye vaprista vaJehovha, nokuti naivowo vatsigira Dhavhidhi. Vaiziva kuti akanga achitiza, asi havana kundiudza.” Asi varanda vamambo vakanga vasingadi kusimudza ruoko kuti vauraye vaprista vaJehovha.
18 Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.
Ipapo mambo akarayira Dhoegi akati, “Iwe, tendeuka uuraye vaprista.” Saka Dhoegi muEdhomu akatendeuka akavauraya. Pazuva iroro akauraya varume makumi masere navashanu vakanga vakapfeka efodhi yomucheka.
19 O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile.
Akaparadzawo Nobhi, guta ravaprista, navarume varo navakadzi, navana navacheche, nemombe dzaro, mbongoro namakwai.
20 Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid.
Asi Abhiatari, mwanakomana waAhimereki, mwanakomana waAhitubhi, akapunyuka akatiza akandobatana naDhavhidhi.
21 Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị.
Akaudza Dhavhidhi kuti Sauro akanga auraya vaprista vaJehovha.
22 Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị.
Ipapo Dhavhidhi akati kuna Abhiatari “Zuva riya, Dhoegi muEdhomu paakanga aripo, ndakaziva kuti zvirokwazvo aizoudza Sauro. Ndini ndaurayisa baba vako nemhuri yavo yose.
23 Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”
Gara neni; usatya; munhu ari kutsvaka mweya wako anotsvaka nowanguwo. Uchagara wakachengetedzeka kana uneni.”

< 1 Samuel 22 >