< 1 Samuel 20 >

1 Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?”
David salió de Naiot en Ramá y se dirigió a Jonatán y le preguntó: ¿Qué he hecho? ¿Cuál es mi crimen y mi pecado contra tu padre que él está tratando de quitarme la vida?
2 Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.”
Y le dijo: de ninguna manera: no serás muerto. Mira, mi padre no hace nada, ni grande ni pequeño, sin avisarme primero. ¿Me ocultaría este secreto? No será así.
3 Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”
Pero David volvió a prestar juramento y dijo: Tu padre ve que soy querido por ti; así se que dice a sí mismo: Que Jonatán no tenga idea de esto, porque será un dolor para él; pero como vive el Señor, y como vive tu alma, solo hay un paso de la muerte.
4 Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.”
Entonces Jonatán dijo a David: Sea cual sea tu deseo, lo haré por ti.
5 Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi.
Y David dijo a Jonatán: Mañana es la luna nueva, y no me sentaré con el rey en su mesa; déjame ir a un lugar seguro en el campo hasta pasado mañana por la tarde.
6 Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’
Y si tu padre se da cuenta del hecho de que estoy ausente, dile, David me pidió que le permitiera ir a Belén, a su ciudad, porque es el momento en que su familia hace su ofrenda año tras año.
7 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ.
Si él dice: “Está bien, tu siervo estará en paz; pero si está enojado, entonces te quedará claro que tiene un propósito malvado en mi contra”.
8 Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?”
Entonces, sé amable con tu siervo; porque has estado unido con tu siervo en un acuerdo hecho ante el Señor, pero si hay algo malo en mí, mátame tú mismo; porque no hay necesidad de que me lleves a tu padre.
9 Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”
Y Jonatán dijo: No pienses así, porque si viera que mi padre estaba planeando el mal contra ti, ¿no te lo diría?
10 Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?”
Entonces David dijo a Jonatán: ¿Quién me dirá si tu padre te da una respuesta de mal modo?
11 Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.
Y Jonatán dijo a David: Ven, salgamos al campo. Y los dos salieron juntos al campo abierto.
12 Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.
Y Jonatán dijo a David: El Señor, Dios de Israel, sea testigo; cuando haya tenido la oportunidad de hablar con mi padre, a esta hora de mañana, si sus sentimientos hacia David son buenos, ¿no le enviaré y le daré las noticias?
13 Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
Que el castigo del Señor sea para Jonatán, si es un placer para mi padre hacerte mal, y no te lo digo ni te mando para que puedas ir en paz, y que el Señor esté contigo, como él ha estado con mi padre.
14 Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
Y que tú, mientras yo todavía vivo, ¡Oh, que seas amable conmigo, como el Señor es bueno, y que me apartes de la muerte!
15 E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
Y no permitas que tu misericordia se separe de mi familia, ni siquiera cuando el Señor ha enviado destrucción a todos los que odian a David, cortándolos de la faz de la tierra.
16 Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
Y si se descubre que el nombre de Jonatán está separado de la familia de David, el Señor hará a David responsable.
17 Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
Y Jonatán volvió a jurar a David por su amor por él: porque David era tan querido para él como su alma.
18 Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
Entonces Jonatán le dijo: Mañana es la luna nueva: y verás que no estás presente, porque no habrá nadie en tu asiento.
19 Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
Y en el tercer día se hará una observación especial, te irás al sitio donde te escondiste la vez pasada, esperando en la colina de allí.
20 Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.
Y al tercer día enviaré flechas desde mi arco contra su costado como si estuvieran en una marca.
21 Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị.
Y enviaré a mi siervo a buscar la flecha. Y si le digo: Mira, la flecha está en este lado tuyo; ¡Tómalo! entonces puedes venir porque hay paz para ti y no hay mal, por el Señor viviente.
22 Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị.
Pero si le digo al niño: Mira, la flecha te ha pasado: luego sigue tu camino, porque el Señor te ha enviado.
23 Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”
En cuanto a lo que tú y yo estábamos hablando, el Señor está entre tú y yo para siempre.
24 Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri.
Entonces David fue a un lugar secreto en el campo, y cuando llegó la luna nueva, el rey tomó su lugar en la fiesta.
25 Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya.
Y el rey tomó asiento, como en otras ocasiones, junto a la pared y Jonatán estaba al frente, y Abner estaba sentado al lado de Saúl, pero no había nadie en el asiento de David.
26 Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha. Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.”
Pero Saúl no dijo nada ese día, porque pensó que algo había sucedido y lo había dejado ritualmente impuro; Está claro que él no se purificó.
27 Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?”
Y al día siguiente de la luna nueva, es decir, el segundo día, todavía no había nadie en el asiento de David y Saúl preguntó a su hijo Jonatán: ¿Por qué el hijo de Isaí no ha venido a la fiesta de ayer? u hoy?
28 Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.
Respondiendo a Saúl, Jonatán dijo: David me insistió que le diera permiso de ir a Belén,
29 Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”
Diciendo: Nuestra familia está haciendo una ofrenda en el pueblo, y mis hermanos me han dado órdenes de estar allí: así que ahora, si tengo gracia en tus ojos, déjame ir a ver a mis hermanos. Por eso no ha venido a la mesa del rey.
30 Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?
Entonces Saúl se enfureció contra Jonatán, y le dijo: Hijo de mujer malvada y perversa, ¿no he visto cómo has entregado tu amor al hijo de Isaí, a tu vergüenza y a la ¿Vergüenza de tu madre?
31 Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”
Porque mientras el hijo de Isaí vive en la tierra, tu posición no es segura y tu reino está en peligro. Así que haz que venga aquí conmigo, porque ciertamente es correcto que lo maten.
32 Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”
Y Jonatán, respondiendo a su padre Saúl, le dijo: ¿Por qué va él a morir? ¿Qué ha hecho?
33 Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid.
Entonces Saúl, apuntándole con su lanza, hizo un intento de herirlo: de lo que quedó claro para Jonatán que el propósito de su padre era matar a David.
34 Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
Entonces Jonatán se levantó de la mesa, ardiendo de ira, y no tomó parte en el banquete el segundo día del mes, estando lleno de dolor por David porque su padre lo había avergonzado.
35 Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa.
Por la mañana, Jonatán salió al campo cuando le dijo a David, y tenía un muchacho con él.
36 Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ.
Y él le dijo al muchacho: Ve y toma la flecha que solté de mi arco. Y mientras el muchacho corría, le envió una flecha.
37 Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”
Y cuando el muchacho llegó al lugar donde estaba la flecha, Jonatán, gritando detrás del muchacho, dijo: ¿No está la flecha más allá de ti?
38 Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.
Y Jonatán siguió gritando por el niño: ve rápido, no te detengas, ve rápido. Y el muchacho de Jonatán tomó la flecha y regresó con su Señor.
39 Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.
Pero el muchacho no tenía idea de lo que estaba pasando; sólo Jonatán y David lo sabían.
40 Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.
Y Jonatán entregó su arco y sus flechas al muchacho, y le dijo: Toma esto y vuelve al pueblo.
41 Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.
Y cuando el muchacho se había ido, David salió de su lugar secreto por la colina, y cayendo a la tierra se inclinó tres veces y uno al otro se dieron un beso, llorando juntos, aunque lloró más David.
42 Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.
Y Jonatán dijo a David: Ve en paz, porque nosotros dos hemos jurado, en el nombre del Señor, diciendo: El Señor estará entre tú y yo, y entre mi simiente y tu simiente para siempre. Entonces David se fue, y Jonatán entró en el pueblo.

< 1 Samuel 20 >