< 1 Samuel 2 >

1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
UHana wasekhuleka esithi: Inhliziyo yami iyathokoza eNkosini. Uphondo lwami luphakanyisiwe eNkosini. Umlomo wami wenziwe banzi phezu kwezitha zami, ngoba ngiyajabula ngosindiso lwakho.
2 “O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
Kakho ongcwele njengeNkosi, ngoba kakho ngaphandle kwakho; futhi kalikho idwala elinjengoNkulunkulu wethu.
3 “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
Lingabe lisakhuluma ngokuzigqaja lokuzigqaja, kungaphumi ukuziqakisa emlonyeni wenu; ngoba iNkosi inguNkulunkulu wolwazi, lezenzo zilinganiswa yiyo.
4 “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
Idandili lamaqhawe lephukile, kodwa abakhubekileyo babhince amandla.
5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
Ababesuthi baziqhatshisile ngesinkwa, lababelambile kabasenjalo, kwaze kwathi oyinyumba uzele abayisikhombisa, lolabantwana abanengi uphele amandla.
6 “Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. (Sheol h7585)
INkosi iyabulala njalo iyaphilisa, iyehlisela engcwabeni njalo yenyuse. (Sheol h7585)
7 Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
INkosi ipha ubuyanga, njalo iyanothisa; iyehlisela phansi, njalo iphakamise.
8 Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
Iyamphakamisa umyanga ethulini, imphakamisa oswelayo enqunjini yomquba, ukuze ibahlalise leziphathamandla, ibadlise ilifa lesihlalo sobukhosi sodumo; ngoba insika zomhlaba zingezeNkosi, ibekile ilizwe phezu kwazo.
9 Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
Izagcina inyawo zabangcwele bayo, kodwa ababi bazathuliswa emnyameni; ngoba umuntu kayikunqoba ngamandla.
10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
Abalwa leNkosi bazaphahlazwa; izaduma phezu kwabo isemazulwini; iNkosi izakwahlulela imikhawulo yomhlaba, inike inkosi yayo amandla, iphakamise uphondo logcotshiweyo wayo.
11 Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
UElkana waya eRama endlini yakhe. Lomfana wayekhonza iNkosi phambi kukaEli umpristi.
12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.
Amadodana kaEli ayengabantwana bakaBheliyali; kawayazanga-ke iNkosi.
13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.
Njalo umkhuba wabapristi labantu wawunje; wonke umuntu ohlaba umhlatshelo, kube sekufika inceku yompristi, inyama isaphekiwe, ilefologwe elencijo ezintathu esandleni sayo,
14 Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.
ihlabe ngayo edengezini, loba egedleleni, loba ebhodweni, loba embizeni; konke ifologwe ekukhuphayo umpristi wayezithathela khona. Benze njalo kuIsrayeli wonke ofika lapho eShilo.
15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.”
Njalo engakatshisi amahwahwa, inceku yompristi ifike ithi emuntwini ohlabayo: Letha inyama yokosela umpristi, ngoba kayikuthatha kuwe inyama ephekiweyo, kodwa eluhlaza.
16 Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.”
Uba lowomuntu esithi kuyo: Kabatshise lokutshisa amahwahwa khathesi, ubusuzithathela njengokuthanda komphefumulo wakho; ibisisithi kuye: Hatshi, nginika khathesi; uba kungenjalo, ngizayithatha ngamandla.
17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.
Ngakho isono samajaha saba sikhulu kakhulu phambi kweNkosi; ngoba abantu badelela umnikelo weNkosi.
18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.
Kodwa uSamuweli wayekhonza phambi kweNkosi engumfana ebhince i-efodi yelembu elicolekileyo.
19 Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.
Futhi unina wayemenzela ijazana, amphathele lona umnyaka ngomnyaka ekwenyukeni kwakhe lomkakhe ukuyahlaba umhlatshelo womnyaka.
20 Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”
UEli wasebabusisa oElkana lomkakhe, wathi: INkosi ikunike inzalo ngalowesifazana endaweni yesicelo esicelwe eNkosini. Basebesiya endaweni yabo.
21 Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.
INkosi isimhambele uHana, wasethatha isisu, wazala amadodana amathathu lamadodakazi amabili. Umfana uSamuweli wasekhula eleNkosi.
22 Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute.
Kodwa uEli wayesemdala kakhulu; wakuzwa konke amadodana akhe akwenza kuIsrayeli wonke, lokuthi ayelala labesifazana ababuthana emnyango wethente lenhlangano.
23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a?
Wasesithi kuwo: Lenzelani izinto ezinje? Ngoba ngiyezwa ngabo bonke abantu ngezenzo zenu ezimbi.
24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu.
Hatshi, madodana ami; ngoba kakusumbiko omuhle engiwuzwayo ukuthi lenza abantu beNkosi baphambuke.
25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi.
Uba umuntu esona komunye, abahluleli bazamahlulela; kodwa uba umuntu esona eNkosini, ngubani ozamlamulela? Kodwa kawalalelanga ilizwi likayise; ngoba iNkosi yayifuna ukuwabulala.
26 Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.
Umfana uSamuweli waseqhubeka ekhula, ethandeka kubo bobabili iNkosi labantu.
27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?
Kwasekufika umuntu kaNkulunkulu kuEli, wathi kuye: Itsho njalo iNkosi: Ngabonakaliswa lokubonakaliswa yini kuyo indlu kayihlo beseGibhithe endlini kaFaro?
28 Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ.
Ngamkhetha yini kuzo zonke izizwe zakoIsrayeli ukuthi abe ngumpristi wami, anikele elathini lami, atshise impepha, agqoke i-efodi phambi kwami? Ngayinika yini indlu kayihlo yonke iminikelo yabantwana bakoIsrayeli eyenziwe ngomlilo?
29 Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.
Kungani likhahlela imihlatshelo yami leminikelo yami engiyilayileyo endlini yami, njalo uhlonipha amadodana akho okwedlula mina, ngokuzikhuluphalisa ngekhethelo leminikelo yonke kaIsrayeli, abantu bami?
30 “Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu.
Ngakho iNkosi uNkulunkulu kaIsrayeli ithi: Ngathi lokuthi: Indlu yakho lendlu kayihlo zizahamba phambi kwami kuze kube nininini; kodwa khathesi ithi iNkosi: Kakube khatshana lami; ngoba abangihloniphayo ngizabahlonipha, labangidelelayo bazakweyiswa.
31 Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi.
Khangela, insuku ziyeza engizaquma ngazo ingalo yakho lengalo yendlu kayihlo, kungabi khona ixhegu endlini yakho.
32 Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị.
Njalo uzabona ukuhlupheka kwendlu yami, kuyo yonke impumelelo ezayenzela uIsrayeli; njalo kakuyikuba lexhegu endlini yakho zonke izinsuku.
33 Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.
Lowo-ke owakho engingayikumquma asuke elathini lami uzakuba ngowokuqeda amehlo akho, lokudabula umphefumulo wakho; lakho konke ukwanda kwendlu yakho kuzakufa kusebudodeni.
34 “‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.
Lalokhu kuzakuba yisiboniso kuwe okuzakwehlela amadodana akho womabili, kuHofini loPhinehasi; bobabili bazakufa ngasuku lunye.
35 Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile.
Ngizazimisela umpristi othembekileyo; uzakwenza njengokusenhliziyweni yami lemphefumulweni wami. Njalo ngizamakhela indlu eqinileyo; uzahamba-ke phambi kogcotshiweyo wami zonke izinsuku.
36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.”’”
Kuzakuthi-ke wonke oseleyo endlini yakho uzakuza akhothame kuye ngenxa yembadalo yesiliva leqebelengwana lesinkwa, athi: Ake ungibeke kwesinye sezikhundla zompristi ukuze ngidle ucezu lwesinkwa.

< 1 Samuel 2 >