< 1 Samuel 17 >
1 Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.
The Philistine armies gathered for battle at Socoh in Judah. They set up camp between Socoh and Azekah in Ephes-dammim.
2 Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia.
Saul and the Israelites gathered and camped in the Valley of Elah and took up their positions to engage in battle with the Philistines.
3 Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.
The Philistines were on one hill and the Israelites on another with the valley between them.
4 Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat, onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.
Then a champion came out of the Philistine camp. His name was Goliath from Gath, and he was six cubits and a span tall.
5 O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa.
He had on his head a bronze helmet and he wore a bronze coat of mail weighing five thousand shekels.
6 O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ.
On his legs he wore bronze armor, and he carried a javelin slung between his shoulders.
7 A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya.
The shaft of his spear was as thick as weaver's beam, with an iron tip that weighed six hundred shekels. His shield-bearer walked ahead of him carrying his shield.
8 Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha Izrel sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye Filistia? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m.
Goliath stood and shouted at the lines of Israelite soldiers, “Why have you come and lined for battle? I am the Philistine, and you're Saul's servants. Pick one of your men and have him come down and fight me.
9 Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!”
If he can fight me and kill me, then we will be your slaves. But if I beat him and kill him, then you'll be our slaves and work for us.”
10 Mgbe ahụ, onye Filistia ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha Izrel aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.”
Then the Philistine said, “I mock the battle lines of Israel today! Give me a man so we can fight each other!”
11 Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu.
Saul and all the Israelite soldiers were shattered and absolutely terrified when they heard what the Philistine said.
12 Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke.
David was the son of a man named Jesse. He was an Ephrathite from Bethlehem of Judah who had eight sons. At the time Saul was king, Jesse was very old.
13 Atọ nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ Eliab, ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na Shama, nwa nke atọ.
Jesse's three oldest sons had joined Saul's army war. These were Eliab (the firstborn), Abinadab (second), and Shammah (third).
14 Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.
David was the youngest. The three oldest were with Saul,
15 Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem.
while David went to Saul and then back again to look after his father's sheep.
16 Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ.
Every morning and evening for forty days the Philistine came out to take his stand.
17 Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha.
Jesse told his son David, “Please take your brothers this ephah of roasted grain and these ten loaves of bread for your brothers. Take them quickly to your brothers' camp.
18 Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”
Take these ten cheese pieces to their commander. Check carefully to see how your brothers are doing and bring back their news.”
19 Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha.
They were with Saul and the whole Israelite army in the Valley of Elah, fighting the Philistines.
20 Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha.
David got up early in the morning and left the flock with a shepherd. He took the supplies and set out as Jesse had told him to. He arrived at the camp just as the army was marching out to its battle line, shouting the war cry.
21 Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
The Israelites took up their battle line and the Philistines took up their battle line on the opposite side.
22 Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha.
David left his supplies with the one responsible and ran to the battle line. When he got there he asked his brothers how they were.
23 Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru.
While he was talking with them, Goliath, the Philistine champion from Gath, came up out of his lines and shouted his challenge as he had before, and David heard what he said.
24 Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu.
All the Israelite soldiers ran away when they saw him because they were terribly afraid.
25 Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!”
“Have you seen this man who keeps on coming out to mock Israel?” they asked. “The king will make the man who kills him really rich. He will also give him his daughter in marriage, and his family will live tax-free in Israel.”
26 Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?”
David asked the men who were standing beside him, “What will the man receive who kills this Philistine and removes this shame from Israel? Who does this heathen Philistine think he is, mocking the armies of the living God?”
27 Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya.
The soldiers repeated what they had said, telling him, “This is what the man who kills him will receive.”
28 Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”
When David's oldest brother Eliab heard him talking with the men, he got angry with him. “What are you doing here?” he asked. “Who have you left those few sheep with in the wilderness? I know how proud and wicked you are! You've just come to watch the battle!”
29 Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”
“What have I done now?” David asked. “Can't I even ask a question?”
30 Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
He went over to some others and asked the same question, and they gave the same answer as before.
31 Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.
Someone overheard what David said and reported it to Saul who sent for him.
32 Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
David told Saul, “No one should lose heart because of this Philistine. I, your servant, will go and fight him!”
33 Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.”
“You can't go out and fight this Philistine,” Saul replied. “You're just a boy, and he's a warrior trained from his youth.”
34 Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,
David replied, “Your servant has been looking after his father's sheep. When a lion or a bear came and took a lamb from the flock,
35 achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.
I would chase after it, knock it down, and save the lamb from its mouth. If it turned to attack me, I would grab its hair, hit it, and kill it.
36 Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!
I have killed lions and bears, and this heathen Philistine will be just like one of them, for he has mocked the armies of the living God.”
37 Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.”
David concluded, “The Lord who saved me from the claws of the lion and the bear will save me from this Philistine.” “Go, and may the Lord be with you,” Saul responded.
38 Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.
Saul gave David his own battle clothes to wear, placed a bronze helmet on his head, and put armor on him.
39 Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha.
David strapped his sword on over the armor but he couldn't walk because he wasn't used to it. “I can't walk in all this,” David told Saul. “I ‘m not used to it.” So David took all the armor off.
40 Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.
He picked up his stick, chose five smooth stones from the stream, and put them in his shepherd's bag. Carrying his sling in his hand, he approached the Philistine.
41 Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya.
The Philistine came towards David, closer and closer, with his shield-bearer in front of him.
42 O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya.
When the Philistine looked closely he could see that David was just a red-faced handsome youth, and so he treated David with contempt.
43 Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ.
“Do you think I'm a dog, coming to fight me with a stick?” the Philistine asked David, and he cursed David by his gods.
44 Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!”
Then the Philistine shouted at David, “Come over here, and I'll feed your flesh to the birds and the wild animals.”
45 Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.
David replied to the Philistine, “You come to attack me with a sword, a spear, and a javelin. But I come to attack you in the name of the Lord Almighty, the God of the armies of Israel—the one you have mocked.
46 Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.
Today the Lord will hand you over to me, and I will strike you down, cut off your head, and give the dead bodies of the Philistine soldiers to the birds and the wild animals. Then all the world will know that there is a God who acts for Israel.
47 Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
Everyone gathered here will realize that the Lord saves, but not with sword and spear. For the battle is the Lord's, and he will hand all of you over to us.”
48 Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.
As the Philistine moved forward to attack him, David raced toward the battle line to confront him.
49 Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.
David reached into his bag, took out a stone, and fired it from his sling, hitting the Philistine on the forehead. The stone went into his forehead, and he collapsed facedown on the ground.
50 Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.
This is how David defeated the Philistine with just a sling and a stone; with no sword in his hand David knocked the Philistine down and killed him.
51 Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.
David ran and stood over the Philistine. He took the Philistine's sword and pulled it out of its sheath. He killed him and then he cut off his head with the sword. When the Philistines saw that their champion was dead, they turned and ran away.
52 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.
Then the men of Israel and Judah rushed forward shouting the war-cry and chased the Philistines all the way to Gath and to the gates of Ekron. Their bodies were scattered along the Shaaraim road to Gath and Ekron.
53 Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.
When the Israelites returned from their hot pursuit of the Philistines, they plundered their camps.
54 Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya.
David took the Philistine's head and brought it to Jerusalem, but he put the Philistine's weapons in his own tent.
55 Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.”
When Saul had watched David going out to fight the Philistine, he'd asked Abner the army commander, “Abner, whose son is that young man?” “On your life, Your Majesty, I do not know,” Abner replied.
56 Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.”
“Find out whose son this young man is,” the king ordered.
57 Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid.
As soon as David returned from killing the Philistine, Abner took him and brought him before Saul. David was still clutching the Philistine's head in his hand.
58 Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?” Devid zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke Jesi onye Betlehem.”
“Whose son are you, young man?” Saul asked. “I am the son of your servant Jesse of Bethlehem,” David replied.