< 1 Samuel 16 >

1 Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”
И сказал Господь Самуилу: доколе будешь ты печалиться о Сауле, которого Я отверг, чтоб он не был царем над Израилем? Наполни рог твой елеем и пойди; Я пошлю тебя к Иессею Вифлеемлянину, ибо между сыновьями его Я усмотрел Себе царя.
2 Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’
И сказал Самуил: как я пойду? Саул услышит и убьет меня. Господь сказал: возьми в руку твою телицу из стада и скажи: “я пришел для жертвоприношения Господу”;
3 Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”
и пригласи Иессея и сыновей его к жертве; Я укажу тебе, что делать тебе, и ты помажешь Мне того, о котором Я скажу тебе.
4 Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”
И сделал Самуил так, как сказал ему Господь. Когда пришел он в Вифлеем, то старейшины города с трепетом вышли навстречу ему и сказали: мирен ли приход твой?
5 Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.
И отвечал он: мирен, для жертвоприношения Господу пришел я; освятитесь и идите со мною к жертвоприношению. И освятил Иессея и сыновей его и пригласил их к жертве.
6 Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
И когда они пришли, он, увидев Елиава, сказал: верно, сей пред Господом помазанник Его!
7 Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
Но Господь сказал Самуилу: не смотри на вид его и на высоту роста его; Я отринул его; Я смотрю не так, как смотрит человек; ибо человек смотрит на лице, а Господь смотрит на сердце.
8 Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
И позвал Иессей Аминадава и подвел его к Самуилу, и сказал Самуил: и этого не избрал Господь.
9 Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
И подвел Иессей Самму, и сказал Самуил: и этого не избрал Господь.
10 Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”
Так подводил Иессей к Самуилу семерых сыновей своих, но Самуил сказал Иессею: никого из этих не избрал Господь.
11 Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”
И сказал Самуил Иессею: все ли дети здесь? И отвечал Иессей: есть еще меньший; он пасет овец. И сказал Самуил Иессею: пошли и возьми его, ибо мы не сядем обедать, доколе не придет он сюда.
12 Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”
И послал Иессей и привели его. Он был белокур, с красивыми глазами и приятным лицем. И сказал Господь: встань, помажь его, ибо это он.
13 Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema.
И взял Самуил рог с елеем и помазал его среди братьев его, и почивал Дух Господень на Давиде с того дня и после; Самуил же встал и отошел в Раму.
14 Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl.
А от Саула отступил Дух Господень, и возмущал его злой дух от Господа.
15 Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.
И сказали слуги Сауловы ему: вот, злой дух от Бога возмущает тебя;
16 Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”
пусть господин наш прикажет слугам своим, которые пред тобою, поискать человека, искусного в игре на гуслях, и когда придет на тебя злой дух от Бога, то он, играя рукою своею, будет успокаивать тебя.
17 Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”
И отвечал Саул слугам своим: найдите мне человека, хорошо играющего, и представьте его ко мне.
18 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”
Тогда один из слуг его сказал: вот, я видел у Иессея Вифлеемлянина сына, умеющего играть, человека храброго и воинственного, и разумного в речах и видного собою, и Господь с ним.
19 Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”
И послал Саул вестников к Иессею и сказал: пошли ко мне Давида, сына твоего, который при стаде.
20 Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
И взял Иессей осла с хлебом и мех с вином и одного козленка, и послал с Давидом, сыном своим, к Саулу.
21 Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.
И пришел Давид к Саулу и служил пред ним, и очень понравился ему и сделался его оруженосцем.
22 Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”
И послал Саул сказать Иессею: пусть Давид служит при мне, ибо он снискал благоволение в глазах моих.
23 Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.
И когда дух от Бога бывал на Сауле, то Давид, взяв гусли, играл, - и отраднее и лучше становилось Саулу, и дух злой отступал от него.

< 1 Samuel 16 >