< 1 Samuel 15 >
1 Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.
USamuyeli wathi kuSawuli, “Mina yimi engathunywa nguThixo ukuthi ngikugcobe ukuba yinkosi yabantu bakhe u-Israyeli; ngakho-ke khathesi lalela ilizwi elivela kuThixo.
2 Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.
Nanku okutshiwo nguThixo uSomandla: ‘Ama-Amaleki ngizawajezisa ngenxa yalokhu akwenzayo ku-Israyeli lapho abacathamela ekuphumeni kwabo eGibhithe.
3 Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’”
Khathesi hamba uyehlasela ama-Amaleki uqede du konke okungokwawo. Ungawayekeli; bulala amadoda labafazi, abantwana lensane, inkomo lezimvu, amakamela kanye labobabhemi.’”
4 Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda.
Ngakho uSawuli wabiza abantu wababuthanisa eThelayimi, izinkulungwane ezimbili zebutho lezinyawo kanye lamadoda azinkulungwane ezilitshumi avela koJuda.
5 Sọl duuru ndị agha ya gaa zoo nʼakụkụ iyi tara ata dị nso nʼobodo ndị Amalek.
USawuli waya edolobheni lase-Amaleki bacathama edongeni.
6 Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha.
Wasesithi kumaKheni, “Sukani, tshiyani ama-Amaleki ukuze ngingaliqothuli kanye lawo; ngoba lina latshengisa umusa kuwo wonke ama-Israyeli ekuphumeni kwawo eGibhithe.” Ngakho amaKheni asuka kuma-Amaleki.
7 Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt.
Lapho-ke uSawuli wahlasela ama-Amaleki umango wonke kusukela eHavila kusiya eShuri, empumalanga kweGibhithe.
8 O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile.
Wathumba u-Agagi inkosi yama-Amaleki ephila, kodwa bonke abantu bakhe wabaqothula ngokupheleleyo, ngenkemba.
9 Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.
Kodwa uSawuli lebutho kabambulalanga u-Agagi lezimvu ezinhle lenkomo, amathole anonileyo lamawundlu lakho konke okwakukuhle. Lokhu babengafisi ukukuqeda ngokupheleleyo, konke okwakuseyiseka lokungelasizo bakuqeda du.
10 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị,
Ilizwi likaThixo laselifika kuSamuyeli lisithi,
11 “Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile.
“Ngilusizi ngokuthi ngibeke uSawuli waba yinkosi, ngoba usengifulathele njalo kalandelanga imilayo yami.” USamuyeli wakhathazeka, wakhuleka kuThixo bonke lobobusuku.
12 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.”
USamuyeli wavuka ekuseni kakhulu ukuba ayebonana loSawuli, kodwa watshelwa ukuthi, “USawuli uye eKhameli. Uzibekele ilitshe lesikhumbuzo sakhe khonale wasephenduka esehlela eGiligali.”
13 Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”
Kwathi uSamuyeli esemficile, uSawuli wathi, “Uthixo kakubusise! Sengikwenzile engikulaywe nguThixo.”
14 Ma Samuel jụrụ ya sị, “Gịnị bụ ube atụrụ ndị a m na-anụ? Ebee ka ube igwe ehi ndị a si na-ada?”
Kodwa uSamuyeli wathi, “Pho ukukhala kwezimvu ezindlebeni zami lokhu kuyini na? Kuyini ukubhonsa kwezinkomo lokhu engikuzwayo na?”
15 Sọl zara sị, “Ndị agha m si nʼetiti ndị Amalek chịta ụfọdụ nʼime atụrụ na ehi ndị mara mma nke ha chọrọ iji chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ.”
USawuli waphendula wathi, “Amabutho azilethe zivela kuma-Amaleki; agcine izimvu ezinhle lenkomo ukuba azenze umhlatshelo kuThixo uNkulunkulu wakho, kodwa ezinye sizikhucule.”
16 Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe Onyenwe anyị gwara m nʼabalị!” Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?”
USamuyeli wathi kuSawuli, “Mana! Wothi ngikutshele okutshiwo nguThixo kimi ebusuku obedluleyo.” USawuli waphendula wathi, “Ngitshela.”
17 Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel.
USamuyeli wasesithi, “Lanxa wazibona umncane, kawuzange ube yinhloko yezizwana zako-Israyeli na? Uthixo wakugcoba ukuba ube yinkosi ko-Israyeli.
18 Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’
Njalo wakuthuma emsebenzini, esithi, ‘Hamba uyeqothula abantu labayana ababi, ama-Amaleki, uvuse impi labo uze ubaqede du.’
19 Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?”
Pho kungani ungalalelanga uThixo? Kungani uzithathele impango wenza okubi phambi kukaThixo na?”
20 Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile.
USawuli wathi, “Kodwa mina ngimlalele uThixo. Ngihambile emsebenzini uThixo anginike wona. Ama-Amaleki ngiwaqede du, ngabuya lo-Agagi inkosi yawo.
21 Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.”
Amabutho athatha izimvu lenkomo empangweni, ezinhle zalezo ezazahlukaniselwe uNkulunkulu, ukuze zenziwe umhlatshelo kuThixo uNkulunkulu wakho eGiligali.”
22 Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.
Kodwa uSamuyeli waphendula wathi: “Kambe uThixo uthokozela iminikelo yokutshiswa lemihlatshelo ngokunjengokulalela ilizwi likaThixo na? Ukulalela kungcono kulomhlatshelo, lokukhathalela kungcono kulamahwahwa enqama.
23 Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa, mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị. Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”
Ngoba ukuhlamuka kufana lesono sokuhlahlula, lobuqholo bufana lobubi bokukhonza izithombe. Ngoba ilizwi likaThixo ulalile, usekwalile njengenkosi.”
24 Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ.
USawuli wasesithi kuSamuyeli, “Ngenzile isono. Ngephule umlayo kaThixo leziqondiso zakho. Ngesabe abantu ngavumela okwabo.
25 Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị ofufe.”
Khathesi-ke ngiyakucela, thethelela isono sami ubuyele emuva lami, ukuze ngikhonze uThixo.”
26 Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!”
Kodwa uSamuyeli wathi kuye, “Angiyikubuyela emuva lawe. Ilizwi likaThixo ulalile, njalo uThixo usekwalile njengombusi wako-Israyeli!”
27 Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara.
Kwathi uSamuyeli ephenduka ukuba asuke, uSawuli wabamba umphetho wesembatho sakhe, sasesidabuka.
28 Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa Onyenwe anyị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma.
USamuyeli wathi kuye, “Uthixo usewudabule kuwe lamhla umbuso wako-Israyeli, njalo usewunike omunye wabomakhelwane bakho, lowo ongcono kulawe.
29 Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!”
Yena oyiNkazimulo ka-Israyeli kaqambi manga kumbe aguqule ingqondo yakhe, ngoba kasumuntu ukuba aguqule ingqondo yakhe.”
30 Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.”
USawuli waphendula wathi, “Ngenzile isono. Kodwa ake ungihloniphe phambi kwabadala babantu bami laphambi kuka-Israyeli; buyela lami, ukuze ngiyekhonza uThixo uNkulunkulu wakho.”
31 Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị.
Ngakho uSamuyeli wabuyela loSawuli wasekhonza uThixo.
32 Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.” Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.”
USamuyeli wasesithi, “Ngilethelani u-Agagi inkosi yama-Amaleki.” U-Agagi waya kuye ngokwethemba ecabanga esithi, “Impela intukuthelo yokufa isiphelile.”
33 Ma Samuel kwuru sị, “Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.” Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal.
Kodwa uSamuyeli wathi, “Njengoba inkemba yakho yenze abesifazane baswela abantwana, ngokunjalo unyoko kazukuba lomntwana phakathi kwabesifazane.” USamuyeli wambulala u-Agagi phambi kukaThixo eGiligali.
34 Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya.
Emva kwalokho uSamuyeli wasuka waya eRama, kodwa uSawuli waya emzini wakhe eGibhiya yakoSawuli.
35 Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara Onyenwe anyị na o mere Sọl eze ndị Izrel.
USamuyeli kwaze kwaba lusuku lokufa kwakhe engazange ayembona uSawuli futhi, lanxa uSamuyeli wamlilela uSawuli. Uthixo wakhathazeka ngokuthi wayenze uSawuli waba yinkosi yako-Israyeli.