< 1 Samuel 13 >

1 Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.
Saul was ruling for less than a year, when he ruled during year two over Israel,
2 Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.
that Saul chose for himself three thousand men of Israel, of which two thousand were with Saul in Michmash and in the hill country of Bethel, and one thousand were with Jonathan in Gibeah of Benjamin. And the rest of the people he sent away, each to his own home.
3 Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.”
Now Jonathan struck the garrison of the Philistines that was at Gibeah, and the Philistines heard of it. Saul blew the trumpet throughout all the land, saying, "Let the Hebrews hear."
4 Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.
All Israel heard that Saul had struck the garrison of the Philistines, and also that Israel had become repulsive to the Philistines. So the people were called out to join Saul at Gilgal.
5 Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.
The Philistines assembled themselves together to fight with Israel, and brought up against Israel three thousand chariots, and six thousand horsemen, and people as the sand which is on the seashore in multitude: and they came up, and camped in Michmash, eastward of Beth Aven.
6 Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.
When the men of Israel saw that they were in trouble (for the people were in a difficult situation), then the people hid themselves in caves and thickets, among the rocks, and in pits and cisterns.
7 Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.
Now some of the Hebrews had gone over the Jordan to the land of Gad and Gilead; but as for Saul, he was yet in Gilgal, and all the people followed him trembling.
8 Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.
And he stayed seven days, according to the time that Samuel had said. But Samuel did not come to Gilgal, and the people began to abandon him.
9 Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ.
Saul said, "Bring here the burnt offering to me, and the peace offerings." He offered the burnt offering.
10 Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya.
It came to pass that as soon as he had made an end of offering the burnt offering, look, Samuel came; and Saul went out to meet him, that he might greet him.
11 Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha,
Samuel said, "What have you done?" Saul said, "Because I saw that the people were scattered from me, and that you did not come within the days appointed, and that the Philistines assembled themselves together at Michmash;
12 echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.”
therefore I said, 'Now the Philistines will come down on me to Gilgal, and I haven't entreated the favor of Jehovah.' I forced myself therefore, and offered the burnt offering."
13 Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile.
Samuel said to Saul, "You have done foolishly. You have not kept the commandment of Jehovah your God, which he commanded you; for now Jehovah would have established your kingdom on Israel forever.
14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”
But now your kingdom shall not continue. Jehovah has sought for himself a man after his own heart, and Jehovah has appointed him to be prince over his people, because you have not kept that which Jehovah commanded you."
15 Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii.
And Samuel arose and departed from Gilgal, and the rest of the people went up after Saul to meet him after the men of war, when they had come up from Gilgal to Gibeah of Benjamin. And Saul numbered the people who were present with him, about six hundred men.
16 Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.
Saul, and Jonathan his son, and the people who were present with them, stayed in Geba of Benjamin: but the Philistines camped in Michmash.
17 Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,
The spoilers came out of the camp of the Philistines in three companies: one company turned to the way that leads to Ophrah, to the land of Shual;
18 nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.
and another company turned the way to Beth Horon; and another company turned toward the border that overlooks the valley of Zeboim.
19 Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”
Now there was no blacksmith found throughout all the land of Israel; for the Philistines had said, "Otherwise the Hebrews will make swords or spears."
20 Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.
But all Israel would go down to the Philistines, each to sharpen his plowshare, mattock, axe, and sickle;
21 Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ.
and the charge was one payim for the plowshares and for the mattocks, and three shekels for picks and axes and to set the goads.
22 Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.
So on the day of the battle of Michmash there was neither sword nor spear found in the hand of any of the people who were with Saul and Jonathan; but Saul and his son Jonathan had them.
23 Ugbu a ndị Filistia e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na Mikmash.
The garrison of the Philistines went out to the pass of Michmash.

< 1 Samuel 13 >