< 1 Samuel 12 >

1 Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze.
Samweli aksema na Israeli wote, “Nimesikia kila kitu mlichoniambia, na nimemweka mfalme juu yenu.
2 Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.
Basi, yupo hapa mfalme aliyeko mbele yenu, mimi nimezeeka nakujaa mvi; na watoto wangu wako pamoja nanyi. Nimekuwa kiongozi wenu tangu ujana wangu hadi leo.
3 Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
Mimi niko hapa, Nishuhudieni mbele za BWANA na mbele za mtiwa mafuta wake. Nimechukua ng'ombe wa nani? Nimechukua punda wa nani? Ni nani nimemdhulumu? Nimemwonea nani? Nimepokea rushwa kutoka mikono ya nani inipofushe macho yangu? Nishuhudieni, nami nitawarudishia
4 Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.”
Nao wakasema, Haujatudanganya, kutuonea, au kuiba chochote kutoka mkono wa mtu yeyote.”
5 Samuel zara sị ha, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”
Akawaambia, “BWANA ni shahidi juu yenu, na masihi wake leo ni shahidi, kwamba hamkuona kitu mkononi mwangu.” Na wao wakajibu, “BWANAni shahidi.”
6 Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.
Samweli akawaambia watu, “BWANA ndiye aliyemteua Musa na Haruni, na ndiye aliyewatoa baba zenu kutoka nchi ya Misri.
7 Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu Onyenwe anyị ka m chetara unu ihe ọma niile Onyenwe anyị meere unu na nna nna unu ha.
Basi sasa, jihudhurisheni, ili niweze kutoa utetezi juu yenu kwa BWANA kuhusu matendo yote ya haki ya BWANA, ambayo aliwafanyia ninyi na baba zenu.
8 “Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.
Yakobo alipokuwa amefika Misri, na babu zenu walimlilia BWANA. BWANA alimtuma Musa na Haruni, waliowaongoza babu zenu kutoka Misri na wakaja kukaa sehemu hii.
9 “Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ.
Lakini walimsahau BWANA Mungu wao; akawauza katika mkono wa Sisera, jemedari wa majeshi ya Hazori, katika mkono wa Wafilisti, na katika mkono wa mfalme wa Moabu; hawa wote walipigana na babu zenu.
10 Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtalaOnyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’
Wakamlilia BWANA mkasema, 'Tumefanya dhambi, kwa sababu tumemwacha BWANA na tumewatumikia Mabaali na Mashtorethi. Lakini sasa tuokoe kutoka mikono ya maadui zetu, na tutakutumikia.'
11 Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.
Hivyo BWANA akawatuma Yerubu Baali, Bedani, Yefta na Samweli, na akawapa ushindi dhidi ya maadui zenu wote waliowazunguka, na kwamba mliishi kwa amani.
12 “Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.
Mlipoona kwamba Nahashi mfalme wa watu wa Amoni amekuja dhidi yenu, mkaniambia, 'Hapana! Badala yake, mfalme awepo atawale juu yetu'- ingawa BWANA, Mungu wenu, alikuwa mfalme wenu.
13 Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.
Sasa yupo hapa mfalme ambaye mmemchagua, mliyemuomba na ambaye BWANA amemteua awe mfalme juu yenu.
14 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.
Ikiwa mnamhofu BWANA, mtumikieni, muitii sauti yake, msikaidi amri ya BWANA, basi wote wawili ninyi na mfalme anayewatawala mtakuwa wafuasi wa BWANA Mungu wenu.
15 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.
Kama hamtaitii sauti ya BWANA, mkaasi amri za BWANA, ndipo mkono wa BWANA utakuwa juu yenu, kama ulivyokuwa juu ya babu zenu.
16 “Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.
Hata sasa muwepo kabisa na muone jambo kubwa ambalo BWANA atalifanya mbele ya macho yenu.
17 Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”
Je, leo si mavuno ya ngano? Nitamwomba BWANA, naye ataleta ngurumo na mvua. Ndipo mtajua na kuona kwamba uovu wenu ni mwingi, mlioufanya machoni pa BWANA, kujiombea mfalme wenu ninyi wenyewe.”
18 Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.
Hivyo Samweli akamwomba BWANA; na siku iyo hiyo BWANA akatuma ngurumo na mvua. Ndipo watu wote wakamwogopa sana BWANA pamoja na Samweli.
19 Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”
Kisha watu wote wakamwambia Samweli, “Waombee watumishi wako kwa BWANA Mungu wako, ili tusife. Kwa maana tumeongeza uovu huu juu ya dhambi zetu tulipojiombea mfalme sisi wenyewe.”
20 Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.
Samweli akawajibu, “Msiogope. Mmefanya uovu wote huu, lakini msigeukie mbali na BWANA, bali mtumikieni BWANA kwa moyo wenu wote.
21 Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
Wala msigeuke na kufuata mambo matupu yasiyo na faida au kuwaokoa, kwa sababu ni ubatili.
22 Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.
Kwa ajili ya jina lake kuu, BWANA hatawakataa watu wake, kwa sababu imempendeza BWANA kuwafanya ninyi kuwa watu kwa ajili yake.
23 Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.
Kwangu mimi, iwe mbali nami kumtenda BWANA dhambi kwa kuacha kuwaombea ninyi. Badala yake, nitawafundisha njia iliyo njema na sahihi.
24 Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.
Mcheni BWANA tu na mtumikieni yeye katika kweli kwa moyo wenu wote. Tafakarini mambo makuu aliyowatendeeni.
25 Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”
Lakini kama mtadumu kufanya uovu, ninyi wote na mfalme wenu mtaangamizwa.”

< 1 Samuel 12 >