< 1 Samuel 10 >

1 Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
So tok Samuel oljeflaska og slo olje på hovudet hans, kysste honom og sagde: «No hev Herren salva deg til fyrste yver arvluten sin.
2 Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?”’
Når du gjeng frå meg, kjem du til å møta tvo menner attmed Rakel-gravi, ved landskilet mot Benjamin ved Selsah. Dei skal segja med deg: «Asnorne du leita etter, er attfunne; far din kjem difor ikkje i hug asnorne meir; men han er illhuga for dykk og segjer: «Kva skal eg gjera for son min?»»
3 “Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
Når du heldt fram derifrå og kjem til Taboreiki, vil du der møta tri menner som er på veg upp til Gud i Betel; ein med tri kid, ein med tri brødleivar og ein med ei vinhit.
4 Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.
Dei helsar deg heil og sæl og gjev deg tvo brød, og du skal taka imot det dei gjev deg.
5 “Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
Deretter kjem du til Guds Gibea, der som filistarvakti held seg. Og når du kjem inn der i byen, råkar du på ein profetflokk som kjem ned frå offerhaugen i profetisk eldhug med harpa, trumma, fløyta og cither.
6 Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
Og Herrens ande skal koma yver deg, so du og kjem i profetisk uppgløding liksom dei. Og du skal verta ein annan mann.
7 Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
Når du ser desse jarteigner ovra seg, so må du gjera det som fyre fell; for Gud er med deg.
8 “Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
So må du ganga ned fyre meg til Gilgal; og der skal eg koma ned til deg og ofra brennoffer og takkoffer. Sju dagar skal du drygja, til dess eg kjem og segjer deg kva du skal gjera.»
9 Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
Då han no vende seg og gjekk frå Samuel; let Gud honom få ein annan hug. Og alle desse jartegnerne kom, same dagen.
10 Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
Då dei kom til Gibea, møtte han ein profetflokk, og Guds ande kom yver honom, so han kom i profetisk eldhug midt imillom deim.
11 Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
Då no alle som kjende honom frå fyrr, fekk sjå honom i profetisk eldhug liksom profetarne, sagde dei seg imillom: «Kva er det som kjem åt son til Kis? Er Saul og millom profetarne?»
12 Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
Ein mann der i grendi svara: «Kven er då deira far?» Av dette kom det ordtaket: «Er Saul og millom profetarne?»
13 Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.
Då eldhugen seig av honom, gjekk han upp på offerhaugen.
14 Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”
Då spurde farbror åt Saul honom og drengen hans: «Kvar hev de vore?» Han svara: «På leit etter asnorne. Då me såg dei ingen stad var å finna, kom me til Samuel.»
15 Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
Farbroren sagde: «Fortel meg kva Samuel sagde med dykk!»
16 Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.
Saul svara: «Han sagde med oss at asnorne var attfunne.» Men det Samuel hadde sagt um kongedømet, nemnde han ikkje med honom.
17 Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
Samuel stemnde folket saman til Herren i Mispa.
18 Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
Og han sagde til Israels-borni: «So segjer Herren, Israels Gud: «Eg hev ført Israel upp frå Egyptarland, eg frelste dykk frå egyptarmagti og frå alle dei kongeriki som trengde dykk.
19 Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”
Men no hev de vanda dykkar Gud, som frelste dykk ut or alle ulukkor og trengslor, og det segjer til honom: «Set ein konge yver oss!» So stig då fram for Herren etter dykkar ættar og ættgreiner.»»
20 Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.
So let Samuel alle Israels ætter stiga fram. Luten fall på Benjamins-ætti.
21 O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.
Då so Benjamins-ætti gjekk fram etter ættgreinerne sine, fall luten på Matri-greini; so fall han på Saul, Kis-sonen. Men då dei leita etter honom, var han ikkje å finna.
22 Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”
Dei spurde då Herren ei venda til: «Er det endå ein mann her?» Herren svara: «Han hev løynt seg millom ferdagodset.»
23 Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.
Dei sprang dit og henta honom. Og då han steig fram millom folket, var han hovudet høgre enn alle dei hine.
24 Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”
Samuel sagde til folket: «Her ser de den som Herren hev valt ut; det finst ingen maken hans i heile folket.» Då sette heile folket i med fagnadrop: «Live kongen!»
25 Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.
Samuel kunngjorde folket kongelovi, og rita henne i ei bok, som han lagde ned framfor Herren. So let Samuel heile folket fara heim att.
26 Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.
Saul gjekk ogso heim til Gibea. Og med honom fylgde ein flokk djerve karar, som var gripne i hjarta av Gud.
27 Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.
Men nokre illmenne sagde: «Kva hjelp kann denne mannen gjeva oss?» Dei vanvyrde honom og bar ingi hyllingsgåva til honom. Men han læst som han inkje gådde.

< 1 Samuel 10 >