< 1 Pita 5 >

1 Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a,
Starješine dakle među vama opominjem, ja sustarješina i svjedok Kristovih patnja, a zato i zajedničar slave koja se ima očitovati:
2 na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi.
pasite povjereno vam stado Božje, nadgledajte ga - ne prisilno, nego dragovoljno, po Božju; ne radi prljava dobitka, nego oduševljeno;
3 Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
i ne kao gospodari Baštine nego kao uzori stada.
4 Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
Pa kad se pojavi Natpastir, primit ćete neuveli vijenac slave.
5 Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
Tako i vi, mladići, podložite se starješinama; svi se jedni prema drugima pripašite poniznošću jer Bog se oholima protivi, a poniznima daruje milost.
6 Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
Ponizite se dakle pod snažnom rukom Božjom da vas uzvisi u pravo vrijeme.
7 Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Svu svoju brigu povjerite njemu jer on se brine za vas.
8 Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
Otrijeznite se! Bdijte! Protivnik vaš, đavao, kao ričući lav obilazi tražeći koga da proždre.
9 Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
Oprite mu se stameni u vjeri znajući da takve iste patnje podnose vaša braća po svijetu.
10 Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. (aiōnios g166)
A Bog svake milosti, koji vas pozva na vječnu slavu u Kristu, on će vas, pošto malo potrpite, usavršiti, učvrstiti, ojačati, utvrditi. (aiōnios g166)
11 Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Njemu vlast u vijeke vjekova! Amen. (aiōn g165)
12 Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.
Pišem vam ukratko, po Silvanu, koga smatram bratom vjernim, da vas ohrabrim i posvjedočim kako je ovo istinska milost Božja. Nje se držite!
13 Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu.
Pozdravlja vas suizabranica u Babilonu i Marko, sin moj.
14 Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.
Pozdravite jedni druge cjelovom ljubavi! Mir svima vama koji ste u Kristu!

< 1 Pita 5 >