< 1 Pita 4 >

1 Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie.
Therefore, since Christ suffered for us in the flesh, arm yourselves also with the same mind; for he who has suffered in the flesh has ceased from sin,
2 Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.
that you no longer should live the rest of your time in the flesh for the lusts of men, but for the will of God.
3 Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.
For we have spent enough of our past time doing the desire of the Gentiles, and having walked in lewdness, lusts, drunken binges, orgies, carousings, and abominable idolatries.
4 Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.
They think it is strange that you don’t run with them into the same excess of riot, speaking evil of you.
5 Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
They will give account to him who is ready to judge the living and the dead.
6 Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ.
For to this end the Good News was preached even to the dead, that they might be judged indeed as men in the flesh, but live as to God in the spirit.
7 Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.
But the end of all things is near. Therefore be of sound mind, self-controlled, and sober in prayer.
8 Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
And above all things be earnest in your love among yourselves, for love covers a multitude of sins.
9 Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.
Be hospitable to one another without grumbling.
10 Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi.
As each has received a gift, employ it in serving one another, as good managers of the grace of God in its various forms.
11 Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
If anyone speaks, let it be as it were the very words of God. If anyone serves, let it be as of the strength which God supplies, that in all things God may be glorified through Jesus Christ, to whom belong the glory and the dominion forever and ever. Amen. (aiōn g165)
12 Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.
Beloved, don’t be astonished at the fiery trial which has come upon you to test you, as though a strange thing happened to you.
13 Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
But because you are partakers of Christ’s sufferings, rejoice, that at the revelation of his glory you also may rejoice with exceeding joy.
14 Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu.
If you are insulted for the name of Christ, you are blessed, because the Spirit of glory and of God rests on you. On their part he is blasphemed, but on your part he is glorified.
15 Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike.
But let none of you suffer as a murderer, or a thief, or an evil doer, or a meddler in other men’s matters.
16 Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.
But if one of you suffers for being a Christian, let him not be ashamed; but let him glorify God in this matter.
17 Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke?
For the time has come for judgment to begin with the household of God. If it begins first with us, what will happen to those who don’t obey the Good News of God?
18 Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?”
“If it is hard for the righteous to be saved, what will happen to the ungodly and the sinner?”
19 Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.
Therefore let them also who suffer according to the will of God in doing good entrust their souls to him, as to a faithful Creator.

< 1 Pita 4 >