< 1 Pita 3 >
1 Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla,
Wives, be subject to your own husbands in like manner, that even if some are disobedient to the word, they may be won through the behavior of the wives without the word,
2 mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
having beheld your pure behavior in fear,
3 Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
whose adorning—let it not be that which is outward, of braiding of hair, and of putting around of things of gold, or of putting on of garments,
4 Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
but—the hidden man of the heart, by the incorruptible [thing] of the meek and quiet spirit, which is of great value before God,
5 Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
for thus once also the holy women who hoped on God were adorning themselves, being subject to their own husbands,
6 Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.
as Sarah was obedient to Abraham, calling him “lord,” of whom you became daughters, doing good, and not fearing any terror.
7 Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
Husbands, in like manner, dwelling with [them], according to knowledge, as to a weaker vessel—to the wife—imparting honor, as also being heirs together of the grace of life, that your prayers are not hindered.
8 Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
And finally, be all of one mind, having fellow-feeling, loving as brothers, compassionate, courteous,
9 Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
not giving back evil for evil, or reviling for reviling, but on the contrary, blessing, having known that you were called to this, that you may inherit a blessing;
10 Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
for “he who is willing to love life, and to see good days, let him guard his tongue from evil, and his lips—not to speak guile;
11 Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.
let him turn aside from evil, and do good, let him seek peace and pursue it;
12 Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”
because the eyes of the LORD [are] on the righteous, and His ears—to their supplication, but the face of the LORD [is] against those doing evil”;
13 Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe?
and who [is] he who will be doing you evil, if you may become imitators of Him who is good?
14 Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”
But if you also should suffer because of righteousness, [you are] blessed! And do not be afraid of their fear, nor be troubled,
15 Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.
but sanctify the LORD God in your hearts. And always [be] ready for defense to everyone who is asking of you an account concerning the hope that [is] in you, with meekness and fear,
16 Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.
having a good conscience, so that whenever they speak against you as evildoers, they may be ashamed—[those] who are maligning your good behavior in Christ;
17 Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.
for if the will of God wills it, [it is] better to suffer doing good, than doing evil;
18 Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.
also because Christ suffered once for sin—righteous for unrighteous—that He might lead us to God, indeed having been put to death in the flesh, but having been made alive in the Spirit,
19 Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.
by which, having gone, He also preached to the spirits in prison,
20 Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ.
who sometime [ago] disobeyed when once the long-suffering of God waited, in [the] days of Noah—an ark being prepared—in which few, that is, eight souls, were saved through water,
21 Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,
also an antitype to immersion which now saves you—not a putting away of the filth of flesh, but the question of a good conscience in regard to God, through the resurrection of Jesus Christ,
22 onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.
who is at the right hand of God, having gone on to Heaven—messengers, and authorities, and powers, having been subjected to Him.